Ịlọ Ụwa

"Ịlọ ụwa bụ onye nwụrụ anwụ ịlọghachi ụwa ọzọ n’ụdị nwa a mụrụ ọhụrụ. Ndị Igbo kwenyesịrị ike na mmadụ bichaa ndụ n’ụwa a wee nwụọ na onye ahụ ga-emecha lọghachi ụwa ọzọ dịka nwa a mụrụ ọhụrụ."

Ịlọ ụwa bụ onye nwụrụ anwụ ịlọghachi ụwa ọzọ n’ụdị nwa a mụrụ ọhụrụ. Ndị Igbo kwenyesịrị ike na mmadụ bichaa ndụ n’ụwa a wee nwụọ na onye ahụ ga-emecha lọghachi ụwa ọzọ dịka nwa a mụrụ ọhụrụ. Nwaafọ Igbo ọbụla kwenyesịrị ike n’omenala Igbo kwudoro na o bichaa ndụ ya nwụọ, na ọ ga-abịaghachi azụ.

Ọ bụ nke a mere ọtụtụ ndị Igbo ji eji ọnụ ha ekwu banyere otu ndụ ha ga-adị ma ha bịa ụwa ọzọ. Ụfọdụ ndị tara ahụhụ n’ụwa ha, na-ekwu na ha agaghị ata  n’ụwa ha ọzọ. Ndị ụbịam nyụrụ anya, na-ekwu ma kwenye na ha agaghị abụ ogbenye n’ụwa ha ọzọ.

N’ebe ụfọdụ n’ala Igbo, onye biri ajọ ndụ nwụọ, ụmụnna ya na ndị be ya ga-agba ozu ya okirikiri malite gwawa ozu ya okwu. Okwu ha ga-abụ ka ọ ghara ibi ụdịrị ajọ ndụ o biri n’ụwa ọzọ. Ọzọkwa, ụfọdụ na-enye onye nwụrụ anwụ akara e ji ahụba ya ama. Akara a na-enye aka ịmata onye ahụ ma ọ lọghachi ụwa. Ndị Igbo na-agbakwa afa ma a mụọ nwa ọhụrụ n’aka Dibịa iji mata onye lọghachiri ụwa.

Ọ gbachaa afa, ọ gwa ndị mụrụ nwa onye lọrọ ụwa. Ụfọdụ oge, o nwere ihe a na-eme iji nabata onye ahụ bịara ha ụwa. A na-esikwa n’omume nwatakịrị amata onye lọrọ ụwa. Ụfọdụ oge, omume nwatakịrị na-abụ otu omume onye ahụ lọọrọ ya ụwa kwuru na ọ ga-eme ma ọ bịa ụwa ọzọ. Ndị Igbo kwenyere na nwoke nwere ike ịlọ ụwa nwaanyị. Nwaanyị nwekwara ike ịlọ ụwa nwoke.

Ịlọ ụwa na-akwụdosi ike n’ihe onye ahụ chọrọ ka ọ bụrụ n’ụwa ya ọzọ. Ọ bụ nkwenye ndị Igbo na onye bịara ụwa ọzọ na-emezu ihe niile o kwuru na ọ ga-eme, tinyere ihe ndị ọ gaghị eme.

Onye zuru ohi na ndụ ya nwere ike sị na ọ gaghị eme otu ahụ ọzọ ma ọ lọghachi n’ụwa. Ọ lọghachi, ọ gaghị eme aka ntụtụ ma ọlị. Ịlọ ụwa bụ nkwenye ndị Igbo malitere oge gboo. Ọtụtụ ndị Igbo kwenyekwara na ọ ga-adịgide ebighị ebi.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.