E lewechaa ihe dị n’alụm di na nwunye, onye obi esighị ike asị ka ya nọrọ onwe ya zawa okokporo, iji zere ọnwụnwa na nsogbu a na-ahụ n’alụm di na nwunye. Ma onye kpachara anya jụ ịlụ di maọbụ nwaanyị, ọ hụ ihe ọma na ihe ọjọọ o mere onwe ya n’oge nka ya. Ọ bụghị sọ nke a, akparamagwa ndị mmadụ ga na-egosipụta n’ebe ọ nọ ga-egosi ya na ọ bụ onye iberibe.
N’ala Igbo, nwoke ọbụla tozuru ịlụ nwaanyị ma ọ lụghị, a na-ahụta onye ahụ dịka efufelu maọbụ akaraogori. A bịakwa n’aka nke nwaanyị , a na-ahụ onye dị otu a dịka onye ọgbanje maọbụ onye mmụọ mmiri na-enye nsogbu. Ọ bụghị sọ nke a, a na-ahụta onye dị otu a ka onye agbara ụchụ.
N’agbanyeghị uru na ọghọm a na-ahụ n’alụm di na nwunye, o gbochighị ụmụ mmadụ ịna-amaba n’ime ya bụ okeosimmiri. Ụfọdụ ndị ka osimmiri a na-eri, ebe ụfọdụ ka ọ naghị eri. Alụm di na nwunye dịka okeosimmiri bụ ije a na-akwado tupu a gawa. Ọ bụkwa ihe Igbo kwekọrịtara na mmadụ na-eru ogo ya, ma taa ụfọdụ ji ike awụba n’ime ya site n’ịghọrọ mkpụrụ na-achaghị acha.
A na-ahụta alụm di na nwunye dịka akpa, nke bụ na ihe onye tọghetere n’akpa ahụ, o were. Ụfọdụ na-atọghete ihe ọma, ebe e nwere ndị na-atọghete nsogbu. Ndị Igbo kwetara na ọ bụ ndidi na nnagịde ka e ji eso alụm di na nwunye mere Mike Ejeagha ji sị na ọ bụ otu anya ka e ji alụ di na nwunye. N’eziokwu, ije di siri ike, ọ bụghị ije nne na-agara nwa ya maọbụ ọgụ mmadụ na-alụrụ ibe ya.
Ma di ma nwaanyị a na-alụ alụ nwere ihe ha na-agabiga n’alụm di na nwunye. A bịa ebe ụmụnwoke nọ, ha na-asị na ha ahụsiela anya n’aka ndị ha na-alụ, ebe ụmụnwaanyị na-asị na ọ bụ ha kachaa enwe ndidi. N’eziokwu, ọ bụ ihe mwute na ọtụtụ ụmụ nwaanyị anọrọla ebe ha na-enwe ndidi zute ọnwụ ha n’aka di na-alụ ha.
Ọ bụkwa n’ihi nke a ka ụfọdụ ji kpebie na kama ha ga-anọ hụ ọnwụ ga-egbu ha n’aka di ha, na ọ kaara ha mma ịgbapụ nọọrọ onwe ha n’ihi na ọ bụ onye dị ndụ na-aza oriakụ.
Odee: Osinakachukwu Onyemaechi
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

