Ụfọdụ ihe ụmụnwaanyị na-ahụ n’alụm di na nwunye mere ọtụtụ n’ime ha ji agba alụkwaghịm. E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịme ka nwaanyị gbapụ n’aka di ya. Ihe ndị a gụnyere:
i. Nwaanyị nwere ike ịgbapụ na be di ya n’ihi na di na-alụ ya na-eti ya ihe. Ọtụtụ ụmụnwaanyị n’oge gboo nakwa oge ugbua bụ ndị hụtara onwe ha n’aka di na-akụ ha ihe. Ụfọdụ n’ime ha na-enweta mmerụ ahụ, ebe ụfọdụ na-anwụ ọnwụ maka ihe di ha tiri ha. E nwere ndị di ha na-apịa ụtarị, tie ha ihe n’ihu ọha mmadụ, ma nye ha ntaramahụhụ gosipụtara na ha enweghị okwu aka ha n’ụlọ di ha.
Obi mgbawa na arịrị na-eso ọnọdụ a nwere ike ịme ka nwaanyị gbapụ n’ụlọ di ya.
ii. Enyejughị nwaanyị afọ so n’ihe ndị nwere ike ịme ka nwaanyị gbapụ na di. Ọnọdụ a na-apụta mgbe agụụ bidoro ịgụ nwaanyị nke di ya na-apụghị ịnyeju ya afọ, maọbụ zụtalie ihe na-akpa ya dịka uwe nakwa mkpa ndị ọzọ na-echere nwaanyị aka mgba. Nwaanyị dị otu a nwere ike gbapụ na di, ebe ụfọdụ nwere ike ịnọ ma ụkwụ ha ga-adị n’ezi. Ihe ndị a bụ ihe enyejughị nwaanyị afọ na-ebute makana Igbo kwenyere na nwaanyị bụ ori akụ.
iii. Ọnwụ ike nwere ike ịme ka nwaanyị gbapụ n’ụlọ di ya. E nwere ọtụtụ ezinaụlọ na-enwekarị nsogbu nwa ọhụrụ ịnwụ. Mgbe nwaanyị mụrụ nke mbụ, ọ nwụọ, mụọ nke abụọ ọ nwụọ, tinyere nke atọ na nke anọ hụkwa otu ọdachi ahụ, nwaanyị dị otu a nwere ike gbapụ ọsọ, eleghị anya n’azụ. Ihe na-eri ụmụ ọmụrụ erie ya, makana ọ bụghị sọ ogwe ka apịara akụ.
iv. Amụtaghị nwa sokwazị n’ihe ndị na-eme ka nwaanyị pụọ n’ụlọ di ya. Nwaanyị hụ ihe ọ na-agabiga dịka ịkpọ asị, ịtụ ikpe na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-eweta obi mgbawa na-eweta nwaanyị ịla n’ụlọ nna ya. Ọzọkwa, nwaanyị na-amụtaghị nwa, ọ wee bụrụ na nsogbu a si n’aka di ya, nwaanyị dị otu a nwere ike sikwa n’ụlọ di ya gbapụ.
v. Enyeghị nwaanyị ezi ọnọdụ na ezinaụlọ nwere ike ịme ka ọ gbaa alụkwaghịm. Nwaanyị dị otu a nwere ike gbapụ n’ihi ọnọdụ a.
vi. Ekworo na-adị n’etiti ụmụnwaanyị na-emekwa ka nwaanyị gbapụ n’ụlọ di. Mgbe ekworo bidoro kawanye njọ, ọkachasị n’ezinaụlọ a lụrụ ọtụtụ nwaanyị, nwaanyị nke a ka emegbu nwere ike gbapụ n’ụlọ di ya.
vii. Nwoke ịgba n’iro maọbụ ịṅ ụ mmanya na-aba n’anya na-ebutekwa nwaanyị ịgbapụ na be di ya. Ọtụtụ oge, ụfọdụ ụmụ nwaanyị na-akpọlata di ha n’ụlọ nkwụ ma ha ṅ ụchaa mmanya dachie ụzọ. Ihere na-eso ọnọdụ a nakwazị ụjọ nwaanyị di ya na-agba n’iro na-atụ maka di ya ịbunye ya ọrịa na-akpata nwaanyị isi n’aka nwoke rie mbọmbọ ọsọ.
viii. Nwoke na-akpa nsị maọbụ na-eme arụ dị iche iche. Nwaanyị ọbụla kpọrọ ihe ọjọọ asị anaghị ekwe ka ụmụ ya soro mkpụrụ ọjọọ nna ha. Nwanyị dị otu a na-agba mbọ hụ na ihe di ya metere agaghị eso ụmụ ya n’ọdịnihu. Ya mere nwaanyị dị otu a ji agbapụ n’ụlọ di ya.
N’ikpeazụ, nwoke na-anaghị emeta nwunye ya nke ọma n’elu akwa ndina mgbe ha na-eme mmekọrịta sokwa n’isi sekpụ ntị nwaanyị ji agbapụ n’ụlọ di ya. Tigbuo zọgbuo na-adị n’ezinaụlọ na-emekwa ka nwaanyị gbapụ n’ụlọ di ya.
E nwere ndị na-alụta di okwunụka. Ezinaụlọ dị otu a na-ahụkarị ọgụ na mgba nke nwoke agaghị ekwe nwaanyị ṅ ụọ mmiri tọgbụ iko. Ọzọ yiri ibe ya bụ ezinaụlọ a lụrụ ọtụtụ nwaanyị na-enwe nsogbu ala. A na-ahụkarị ọgbaghara, nakwa tigbuo zọgbuo n’ezinaụlọ dị otu a. Mgbe ọnọdụ a ruru nke na nwanne maọbụ nwanna ga-eji nsị were wepụ ndụ nwanne ya, nwaanyị alụrụ nwere ike si n’ụlọ ahụ pụọ maka ndụ ya.
Odee: Osinakachukwu Onyemaechi
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

