
Ọ bụrụ na e nweghị ihe dị ka ịlụ di, agaghịkwa enwe ihe dị ka ụmụada. Dịka afọ ime na-agba ikpu ama, bụ ka ịlụ di nyere anyị ihe bụ otu Ụmụada. Ụmụada abụghị aha mmadụ. E nweghị otu nwaanyị aha ya bụ ụmụada. O nweghị nne na nna ga-agụ nwa ha nwaanyị ụdị aha ahụ. Ụmụada bụ ọgbakọ. Dịka otu osisi anaghị eme oke ọhịa bụ ka otu nwaanyị apụghị ịbụ ụmụada. N’agbanyeghị ka nwaanyị sịrị bụrụ onye a ma ama, bụrụkwa acharaugo, otu nwaanyị ahụ agaghị aghọ ụmụada. Ihe ọ ka bụkwa bụ nwaada.
Naanị ihe mere ha ịghọ ụmụada bụ maka ha lụrụ di, wee zukọọ nwe otu, aha ya bụ otu ụmụada. Cheta na a nyụkọ mamịrị ọnụ ọ gbọọ ụfụfụ. Ịgurube chịkọọ ụkwụ, ha agbawaa ite. Ihe mere ha ịbụ ụmụada bụ maka ha alụọla di. A chọghị ịma obodo di gị si bịa. Ọ dịghị mkpa ụbọchị ị lụrụ di na ụdị mmanya a ṅụrụ ụbọchị ahụ. Ngwa ngwa nwaanyị lụrụ di ka ọ banyere n’otu ụmụada. Echeghị m na ọ bụ ọbodo niile nwere otu ụmụada. Ọ dị m ka e nwere obodo ma ihe ọ bụ na obodo amaghị ihe ọ bụ. N’ụfọdụ obodo, ihe niile gbasara nwaanyị agwụla ụbọchị ahụ ọ lụrụ di. Dịka ọ na-ala na ụlọ di ya bụ ka a na-echefu ya.
N’obodo ndị ọzọ, ụmụnwaanyị lụrụ di ka nwere ọnụ n’obodo nna ha. Mgbe a lụrụ ha ka ha na-akpa ike. Mgbe ha alụbeghi di, ha na-anọ nwayọọ dịka ndị a na-emegbu emegbu. Ngwa ngwa ha lụrụ di ka ike banyere ha aka dịka onye a tụrụ mkpọrọ ogologo mgbe nke nweere onwe ya n’ike. Ọnụọgụ ụmụada kacha n’ụmụnwaanyị lụrụ di n’obodo dị nso.
Dịka otu ndị ọzọ, ụmụada nwere otu e siri hazie ha. Ha na-enwe ndị ndu na ndị na-achị ha. Ndị isi ha gụnyere:
Onyeisi
Odeakwụkwọ
Osote odeakwụkwọ
Onyeisi nke abụọ
Odeakwụkwọ nke abụọ
Ojide ego
Ojide ego nke abụọ
N’ọtụtụ obodo, otu ụmụada na-enwe ọnụ okwu rue na ha na-abia mgbe e nwere ọgbaaghara n’obodo ha. Mgbe ụfọdụ a na-akpọ ha oku. Mgbe ndị ọzọ ha na-eji aka ha abịa. Otu ọbụla ha sịrị bịa, ọbịbịa ha na-amịta mkpụrụ. N’ala Ọhụhụ nke Ụmụahịa Abịa Steeti, ihe a na-akpọ ha bụ ụmụ amụ amụ. Ị nụ ụmụ amụ amụ, ọ bụ ụmụada ka a na-ekwu okwu ha. Ala Ọhụhụ na-akpọ ha ụmụ amụ amụ n’ihi na ọ bụ n’obodo ahụ ka a mụrụ ha tupu ha alụọ di. Nwaanyị lụrụ di nwere obodo a mụrụ ya tupu di ya alụọ ya.
Mgbe ọbụla ụmụada chọrọ itinye ọnụ n’okwunaụka dị n’obodo nna ha, ha anaghị efere ka nnụnụ bere n’osisi ha hụrụ. Ihe ha na-eme bụ ịbịa n’obodo jụọ ajụjụ, chọpụta nke bụ eziokwu ma nye ndụmọdụ. Ha ghọtara na ha abụghị ụmụnwoke nọchiri obi nke nwekwara ike na ugwu pụrụ iche dịka omenala Igbo si dị.
Ihe ụmụada na-eme bụ inye ndụmọdụ, ọ bụghị ime iwu. Ụzọ ọzọ ụmụada si eme ihe ukwu bụ site n’ịgba akaebe. Ọ bụrụ ihe mere oge ha alụbeghị di, nwaada maọbụ ụmụada hụrụ oge ihe ahụ mere nwere ike ịgba akaebe. E nwere ụmụada bụ amụrụ na ụlọ lụọ na ụlọ. Ndị a bụ ndị a lụrụ n’obodo ha maọbụ obodo dị nke ha nso. E nwere ụmụada bụ amụrụ n’ụlọ lụọ na mba. Ndị a gara ije di n’obodo tere aka. N’ihi ụwa ugbu a bụ ụwa ego na-achị, onye enweghị ego enweghị ọnụ okwu. Ụfọdụ otu ụmụada anaghị enwe ugwu n’obodo nna ha maka omume ha.
E nweela obodo ụmụada mere ihe adịghị nma. Ụmụada n’obodo a kpere ikpe ezighị ezi. E ji ego wee zụrụ akọnauche ha. Ha natara ego ma kpudo eziokwu ihu n’ala. Akaebe niile ha gbara bụ akaebe ụgha, megide onye aka ya dị ọcha. Nke a mere n’ụmụnwoke bụ ndị nwe obodo biliri n’iwe ma kwụsị otu ụmụada ahụ. Rue taa, obodo ahụ enweghị otu ụmụada ọzọ.
Ihe mmụta dị n’edemede a bụ na otu ụmụada niile ga-agba mbọ ịkwụwa aka ha ọtọ. Unu ekpela ikpe adịghị nma. Chetanụ na eziokwu bụ ndụ. Unu emebila ụlọ ochie unu n’ihi na unu enwetala ụlọ ọhụrụ. Ala nna unu dịkwa mkpa ka ala di unu. Kedụ ka obodo a mụrụ unu ga-esi anabata unu ma ọ bụrụ na unu mebiri ya?
N’ọtụtụ obodo ụmụada na-eme ihe pụrụ iche na nzukọ ụmụnwaanyị nke ọnwa asatọ bụ August. Anụrụ m na ọ bụ ụmụada a lụru n’obodo na-eme August meeting gara bido August meeting ahụ n’obodo nna ha. Ha hụrụ ihe dị mma n’obodo a lụrụ ha ma welata ihe ahụ n’obodo a mụrụ ha. Nke a bụ ihe ọma. Ụmụada kwesịrị iwere ya dịka ọrụ ime ka ihe ọma dị n’obodo ha lụrụ di bata n’obodo a mụrụ ha. Cheta ilu Igbo tụrụ sị na ọjị ruo ụlọ, o kwuo ebe o siri bịa.
Ihe ọzọ gbasara ụmụada bụ na ha na-agba ụmụnne ha nwere ego ume iji ego ha mee ka obodo ha dị mma. Mgbe ụmụnwaanyị a lụrụ alụ na-akwado ime ihe adịghị mma, Ụmụada n’ụfọdụ obodo na-egbochi ha ime ihe arụ ahụ. O nwere oge ndị nne n’obodo m chọrọ ịkụrụ mmadụ aka n’apata, ọ bụ ụmụada gbochiri ha. Maka ndị abụghị ndị obodo m, ịkụrụ mmadụ aka n’apata bụ oge ụmụnwaanyị gba ọtọ, gaa n’ụlọ mmadụ, na-anyụ nsị na mamịrị, na kwa ekwu okwu ọjọọ nwere ike igbu onye ahụ maọbụ wetara ya nnukwu nsogbu na ndụ ya.
Ụfọdụ ụmụnwoke anwụọla mgbe gboo n’ihi na ndị nne kụụrụ ha aka n’apata. Mgbe ha chọrọ ịkụrụ otu nwoke aka ya dị ọcha aka n’apata, ụmụada bịara n’ike na ebube ma gbochie ha.
Ekele dịrị ụmụada.
Odee: Iwuọha Prince
+2348138460701
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

