Biafra War Art

Abụ– Alịlị


Odee: Somtochukwu Chiedu
Eserese: Chinweike Nwabuzor

ozoemena #BiafraHeroesDay #BiafraRemembranceDay

Gbim! gbim! gbim!

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ụnwụ, mbibi, ọnwụ,
N’ala Igbo.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọnwụ gburu okorobịa, gbuo agbọghọbịa,
Gbuo onye ukwu, ma gbuo onye nta.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọgụ ana-ada,
Kwashiọkọ ana-emenyụ ụmụaka anya.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Agha riri isi Christopher Ọkigbo.
O riri isi Chuma Nzeọgwụ.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọdumegwu riri mbọmbọ ọsọ.

Biafra wee chiliere ndị Naịjirịa aka elu.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ego ụmụ Igbo dị n’ụlọakụ bara n’akụkọ.
Naanị puku pounds iri abụọ ruru onye ọbụla aka.

Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
E nyere ụmụ Igbo azụ oche.
Maka agha biri n’ezie, mana ịhụnanya, udo na ọṅụ kọrọ ụkọ n’ala anyị eri oge ahụ.

Biafra War Art
Eserese Agha Biafra: Chinweike Nwabuzor

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.