Odee: Somtochukwu Chiedu
Eserese: Chinweike Nwabuzor
ozoemena #BiafraHeroesDay #BiafraRemembranceDay
Gbim! gbim! gbim!
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ụnwụ, mbibi, ọnwụ,
N’ala Igbo.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọnwụ gburu okorobịa, gbuo agbọghọbịa,
Gbuo onye ukwu, ma gbuo onye nta.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọgụ ana-ada,
Kwashiọkọ ana-emenyụ ụmụaka anya.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Agha riri isi Christopher Ọkigbo.
O riri isi Chuma Nzeọgwụ.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ọdumegwu riri mbọmbọ ọsọ.
Biafra wee chiliere ndị Naịjirịa aka elu.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
Ego ụmụ Igbo dị n’ụlọakụ bara n’akụkọ.
Naanị puku pounds iri abụọ ruru onye ọbụla aka.
Gbim! gbim! gbim!
Daa! daa! daa!
E nyere ụmụ Igbo azụ oche.
Maka agha biri n’ezie, mana ịhụnanya, udo na ọṅụ kọrọ ụkọ n’ala anyị eri oge ahụ.

Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

