
N’ụbọchị taa n’afọ 1977 ka a mụrụ Chimamanda n’Enugwu. Ọ bụ nwa nke ise n’ime isii, nne na nna ya mụrụ. Ha bụ ndị Abba, nke dị n’okpuru ọchịchị Njikọka, Anambra Steeti.
Chimamanda bụ onye a maara eri nwata ya na ụbụrụ ya na-anụ ọkụ nke ukwuu. Nke a mere oge ọ malitere akwụkwọ, ọ na-eme nke ọma. Ụfọdụ oge, ọ naghị adabara ya na ndị nkụzi ya. Ma nke a emeghị na e lesịa ule, ọ ghara iso na ndị ka mee ọfụma.
Ọ nwetakwara ọtụtụ onyinye mgbe ọ gụchara akwụkwọ Sekọndịrị, maka ike ọ kpara. N’agbanyeghị na nna ya dụrụ ya ọdụ, ma mee ka ọ banye mahadum maka ịbụ dọktọ, Chimamanda gbanwere nke a, ma chụwa akara aka ya n’ịbụ ọdeakụkọ.
Ka ọ dị afọ iri na itoolu, ọ nwetara onyinye ịgụ akwụkwọ n’efu. Nke a mere o ji hapụ Naịjirịa gawa mahadum Drexel dị na Philadelphia na mba Amerịka. Ebe a ka ọ nọ gụọ “Communication.” O sikwa ebe ahụ gawa mahadum “Eastern Connecticut” ebe o ji nzere na “Communication na Political Science” wee pụta.
Mana nzere ndị a ejughị ya afọ, n’ihi na ọ ghọtara njem ọ bịara n’elu ụwa a, maka ọ bụ mma onye nwere ka o ji ana aka. Nke a mere o ji tinye isi na mahadum Johns Hopkins dị na Baltimore. Ebe a ka o ji nzere na “creative writing” wee pụtazịa, aka wee ghọwa ya nkọ.
Ọ dere akwụkwọ ndị a mere aha ya ji gbasaa n’ụwa dum:
A. Purple Hibiscus(2003)
B. Half of a Yellow Sun(2006)
Ch. The Thing Around Your Neck(2009)
D. Americanah(2013)
Chimamanda a lụọla di, ma mụta otu nwa nwaanyị.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

