Ibi Ugwu

baby 1

Na mbido, ọ dị mkpa ị rụtụ aka na o nweghị mmemme pụrụ iche a na-eme gbasara ibi ugwu. Ibi ugwu so n’ụfọdụ ihe ndị Igbo na-eme mere ọtụtụ ndị mmadụ ji kweta na ha si na agbụrụ ndị Juu pụta. Nke ọzọ bụ inye onyeọbịa ọjị.

Ma ihe dị iche na ibi ugwu ndị Juu na nke Igbo bụ na ndị Juu na-ewere onye a na-ebighị ugwu dịka onye rụrụ arụ, ma ndị Igbo anakwaghị e si otu a eme. N’oge gboo a na-ebi ụmụaka ndị nwoke na ndị nwaanyị ugwu n’ọtụtụ ebe.

Ma ugbu a, site na nchọpụta ndị dọkịta na nkwusa ndị ụka na ọ dịghị uru ibi nwaanyị ugwu bara, akwụsịla ịdị na-ebi ụmụ nwaanyị ugwu n’ọtụtụ ebe. N’ebe ụfọdụ, a na-ebi nwa ugwu mgbe ọ dị ụbọchị atọ a mụrụ ya, ma ebe ndị ọzọ ka ọ na-abụ mgbe ọ dị ụbọchị asatọ a mụrụ ya.

Ọzọkwa, o nwere ndị na-ebi ugwu oge nwa ahụ tozuru okorobịa maọbụ agbọghọbịa. Ụbọchị a ga-ebi ugwu, a na-akpọ onye na-ebi ugwu. Onye dị otu a nwere ike ịbụ nwoke maọbụ nwaanyị. Ọ na-abịa, ọ were mma o ji ebi ugwu. Nne nwa ahụ ga-esinyekwa mmiri ọkụ.

Ọ bịa, egwuo ala ebe ọbara pụtara nwa ahụ n’ahụ ga-agbanye. Otu nwaanyị obi siri ike ga-ekuru nwa ahụ mgbe onye na-ebi ugwu na-ebi ya.

baby 2791786 960 720 1

A malite biwe nwa ahụ ugwu, ọ na-eti mkpu akwa. A na-ekuru mmiri ọkụ na nke oyi na-awụsa ya n’ebe a na-ebi ya ugwu.

circumcision in igboland 1200x865 1

Mgbe e bichara ya ugwu, a na-enye onye rụrụ ọrụ ego, ji, n’ihe ndịọzọ dịka omenala ndị ahụ si dị. O nwekwaghị onye a na-ekwe metụ nwa ahụ aka, ma ọ bụghị nne ya tutu ọ nyụọ mamịrị. Onye biri ugwu ga na-abịakwa e leta nwa ahụ, iji mata ma o bikwara ugwu nke ọma.

Ndeewonụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.