1. Ndị Igbo kwenyere na ọ bụ mmụọ Ahajiọkụ nwe ji. N’ihi nke a, ha na-eme mmemme a iji kelee ya otu o siri nyeere ha aka ịkọpụta ji n’afọ ọbụla. Igbo kweenyere na e kelee onye na nke o mere, o mekwa ọzọ.
2. Ndị Igbo were ji dịka nri kasị nri ndị ọzọ. N’ihi nke a, ha ji mmemme a akwanyere ya ugwu pụrụ iche iji hụ na ọ na-eme nke ọma.
3. Ọ bụkwa oge ndị Igbo ji ekele Chineke, ndịichie, ụmụmmụọ na ihe ofufe ndị ọzọ maka nchekwa na nlekọta ha n’oge ha na-akọ ọrụ, ma bụrụkwa oge ha ji enye ihe ofufe ndị a nri. Nke a mere obodo ụfọdụ ji akpọ mmemme a “Ịlọ Mmụọ.”
4. Ọ bụkwa oge ndị Igbo ji egosipụta ọxụ na ha esila n’oge ọrụ banye n’oge ezumike, na ha esila n’oge ụganị maọbụ ụnwụ banye n’oge uju nri, maka aka aja aja butere ọnụ mmanụ mmanụ.
5. E debekwara mmemme a iji hụ na ndị mmadụ ejighị n’ihi agụụ maọbụ ụbịam gwuo ji ha mgbe ekwesịghị.
6. E jikwa oge mmemme a achọ ọdịmma na ọganihu obodo site n’ịchụ nta ego maka ọrụ mmepe obodo dị iche iche.
7. E jikwa oge a egosi ụwa maka omenala Igbo, tụmadị n’oge a Gọọmenti na-etinye aka na ya. Iji maa atụ, na Steeti Anambra a na-enwe mmemme “Iri ji” kwa afọ, ebe a na-enwekwa mmemme “Ahịajiọkụ” n’Imo Steeti.
Nke a Si N’Omenala Na Ewumewu Igbo Nke C.C Ekwealọ Dere.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.


