
N’ụbọchị taa n’afọ 1857 ka Ajayi Crowther du ndị ‘Christian Missionary Society’ wee weta ozi ọma Chineke n’ala Igbo. Obi Akazụa, nwa ya bụ Ọdịlị tinyere ndị Ọnịcha nabatara ha oge ha bịara. Ọ bụ otu a ka e si wee guzo ‘The Niger Mission.’
Ha rịọrọ ka enye ha ala maka ịgbasa ozi ha jiri bịa. E wee nye ha ala, bido n’ebe ‘ABS’ mechara dị; nke ‘Shoprite’ dịkwasị na ya taa, ruo mmiri Naịja. Ụfọdụ ihe ha mere n’oge mbido bụ ị wepụta ABCHỊỊ nke ha jiri dee akwụkwọ Azụ Ndụ.
Ọzọkwa bụ ntụgharị Baịbụl n’asụsụ Igbo, nke George Nicholas Anyaegbunam bụ nwa afọ Igbo mbụ bụ ụkọchukwu, sokwa gbaa mbọ ka nke a bịa na mmezu. Ebe ‘Archdeacon’ Dennis gbara mbọ n’ụdị pụrụ iche ka mbipụta akwụkwọ a pụta ihe.
Ha guzokwara ụlọakwụkwọ dị iche iche n’ala Igbo, nke DMGS dị n’Ọnịcha bụ otu n’ime ha, tinyere ụlọọgwụ maka ahụike ụmụ mmadụ. N’ezie, ihe ọma ha webatara nyere aka ị mee ka ọtụtụ ụmụ Igbo bụrụ mmadụ, maa werekwa ndụ ha mepụta ihe.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

