Ncheta Richard Ihetu(Dick Tiger)

N’ụbọchị taa n’afọ 1929 ka a mụrụ Richard Ihetu. Na ndụ ya, ọ bụ onye Amaigbo, dị n’Ọrlụ na Imo Steeti. Ọ mụtara ka e si eti ọkpọ n’aka ndị soja mba Briten nọ na Naịjirịa, wee malite egwuregwu na ya n’afọ 1952.

O teghị aka o bidoro, o merie na asọmpi “middle weight” a zọrọ na Naịjirịa. Ọ mabara ala Briten n’afọ 1955 maka iti ọkpọ, mana oge e meriri ya n’ọkpọ anọ ndị mbụ o tiri, ka o jiri ire ya wee gụọ eze ya ọnụ. Maka ọ bụghị ka akị ilu si ada na ntị ka o si atọ.

Nke a mere o ji kee ajị n’ume, kpebie n’ihe niile tara n’abalị ga-abụrịrị anwụ nta, wee malite gbasịba mbọ ike. Mbọ ya mịtara mkpụrụ, maa rụtụ aka n’ihe dị n’ụwa a bụ onye kwe chi ya ekwe. O meriri otu nwa amadi onye ọcha n’afọ 1958, wee bụrụ champịọnụ “middle weight” mba Briten.

Ka agha Biafra malitere, Ihetu dịka onye maa na nwa afọ Igbo anaghị aghọ obodo ahịa rụrụ ndị Biafra ọrụ “Public Relations.” Mana mbibi so agha chi ụmụ ya wee biakute ya, n’ihi ego ya n’ihe ndị ọzọ o nwere, ka agha kpochapụrụ.

Ọ laghachiri Nuu Yọọkụ na mba Amerịka ka agha biri, ebe o nwetara ọrụ dịka onyenche, makana nwa amadi ahụghịzị tụtụrụ, rachaa. Ka ọ dara n’ọrịa cansa, ọ lọtara Naịjirịa, ebe ọ nọ wee nwụọ n’ụbọchị iri na anọ, n’ọnwa Disemba, afọ 1971.

Ka mkpụrụ obi yaa gaa n’ihu, na-ezu ike n’udo.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.