
N’ụbọchị taa n’afọ 1989 ka Samuel Sọchukwuma Ọkwaraji zara oku ọnwụ n’ama egwuregwu futubọọlụ, Surulere, Legọs. Nke a mere oge ndị Naịjirịa na ndị bọọlụ Angola na-achịpụ ya, maka ị gaa zọọ iko mba ụwa na Ịtali.
Na ndụ ya, Sam bụ onye Ọrlụ, Imo Steeti, ma nwekwa isi ọma pụrụ iche. N’agbanyeghị na nna ya nwụrụ, nne ya ekweghị ka onyinye o nwere na ịmaa akwụkwọ bụrụ n’efu. Ọ kabara ahụ gbado anya, ma kwado nwa ya n’akwụkwọ ya.
Nke a mere Sam ji bụrụ ọkaikpe, maa nwekwa nzere na “M.Sc” na ngalaba “International Law.” Ọ nọkwa na-agba mbọ ị nweta “PhD” ya tutu ọ nwụọ. Ọzọkwa, a mara Sam dịka onye na-eji ego ya a banye ụgbọelu wee bịa gbara Naịjirịa bọọlụ, na-ajụghị ndị otu “Nigerian Football Association” ase.
Ihe kachaa mwute bụ na Ọkwaraji ka bụ nwa okorobịa dị naanị afọ iri abụọ na ise, mgbe ọkụ ya nyụrụ. Ọzọ dị ka ibe ya bụna egwuregwu bọọlụ ahụ, fọdụrụ obere oge tutu ọgwụ. Nke a pụtara na n’ime ndụ, anyị nọkwa n’ọnwụ.
Ka mkpụrụ obi ya gaa n’ihu na-ezu ike n’udo.

