
N’ụbọchị taa n’afọ 2007 ka Osita Ọsadebe zara oku ọnwụ.
Na ndụ ya, Osita bụ nwaafọ Atanị nke dị n’okpuru ọchịchị Ọgbarụ na Anambra Steeti. A mụrụ Osita n’ọnwa Maachị nke afọ 1936. Onyinye Osita nwere banyere iti egwu bụ ihe dị n’agbụrụ ya, maka na ndị na-eti egwu, tinyere ndị na-agbakwa egwu juru eju n’agbụrụ ya.
Ọ bụ mgbe ọ nọ ụlọakwụkwọ sekọndịrị n’Ọnịcha, ka ọ malitere nwebe mmasị iti egwu, maka ndị Igbo na-asị na ọ bụ a gụchaa akwụkwọ, a gụọ akara aka. Ọ malitere iti egwu n’ụlọ oriri na nkwari dị na Legọs. Nka o nwere n’iti egwu, tinyere ngwa egwu, bụ nke o mụtara oge ọ nọ n’otu ndị egwu “Empire Rhythm Orchestra,” maka ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ agwọ. E.C. Arinze bụkwazị onyeisi ndị oti egwu ahụ.
Ka ọ kwụụrụ chịm dịka oti egwu, ọ malitere rụtụwa aka n’ụfọdụ ihe ga-enyere obodo anyị aka n’egwu ya, tụmadị ala Igbo. Ọ na-agụ egwu n’asụsụ Igbo, Bekee na “Pidgin English.” Ọ hịara ahụ mmadụ ịnụ egwu Ọsadebe ma ghara ịgba ụkwụ n’ala, gbawa egwu. Ọsadebe tiri egwu ihe ruru afọ iri anọ. Egwu ya kacha daa ụda bụ “Ọsọndị Owendị,” “Ọgazị amaka,” “People’s Club,” “Rịọwa Chukwu,” wdgz.

Oge Ọsadebe gbara afọ iri ise n’afọ 1986 ka odogwu a chetara n’ezie na a gbachaa egwu ọ laa n’ukwu. N’ihi nke a, ọ malitere wepụtaba ohere ka ya na ụmụ ya ụbara ụmụnwaanyị ọ lụrụ mụụrụ ya na-anọkọ.
Osita Ọsadebe nwụrụ n’ụlọọgwụ “St Mary’s Waterbury” dị na Connecticut na mba Amerịka. Ala Igbo ka na-eji egwu ya na-enye mmadụ dum obi ụtọ were echeta ya oge niile.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

