Ọgbanje bụ nwoke maọbụ nwaanyị a mụrụ, ma o bighị ndụ ya ruo n’isi wee nwụọ. Ndị Igbo kwenyere na ọgbanje bụ onye na-anwụ mgbe ọbụla o jiri chọọ. N’ihi ya, tupu ọgbanje abịa ụwa, ọ na-agwa ndị otu ya oge ọ ga-eji lọghachi azụ. Mgbe oge ahụ ruru, ọ jụ ịlọghachi, ndị otu ya ga-amalite nyewe ya nsogbu ka o mezuo nkwa o kwere.
Ọ kachie ntị, ndị otu ya nwere ike ịkpa mkpa mkpa ga-eweta ndụ ya na njedebe. N’ala Igbo, ụmụnwaanyị na-abụkarị ọgbanje karịa ụmụnwoke. Nke a bụ maka ụmụnwaanyị na-eme enyi nke ukwu, na-abanyekwa n’ọtụtụ otu dị iche iche. Ọ bụ otu a ka e si akpọbata ụfọdụ n’ime otu ọgbanje.
Ndị ọgbanje nwere ihe a na-akpọ iyi ụwa. Nke a bụ ihe ha na-eli n’ukwu osisi, maọbụ ebe zoro ezo. Naanị ọgbanje maara ebe o liri iyi ụwa ya. A chọpụta na mmadụ bụ ọgbanje, a na-akpọta dibịa, ọ bịa bọọ iyi ụwa a. Nke a ga-eme ka ọgbanje a ghara ịnwụ ma oge ya erughị. Mana dibịa agaghị ama ebe iyi ụwa a dị, ma ọgbanje ahụ egosighị ya.
Ụzọ ọzọ ndị Igbo si eme ka ọgbanje nọrọ ndụ n’ụwa ya ọzọ bụ ịme ozu ya akaje, ma taa ya nnukwu ahụhụ ma ọ nwụọ. A na-ejikwa mma gbukasịa ozu ọgbanje tupu adọnye ya n’ala. A ga-agwakwa ozu ya ka ọ ghara ịnwụ n’ike n’ụwa ya ọzọ. Ka o bikwaa ndụ ziri ezi, ma ọ bịa ụwa ọzọ. Nwaafọ Igbo ọbụla anaghị ekwe ka nwa ọ mụtara buru ya ụzọ nwụọ.
Maka ọ bụ nwa na-eli, ma kwaa nne maọbụ nna ya dịka o si kwesị. Onye ọ bụla nwa ya bu ụzọ nwụọ na-ajụ ase iji mata ma ọ mụrụ ọgbanje. A naghị ebere ọgbanje akwa ma ọ nwụọ. Nne mụtara ya nwekwara omenala ọ na-agabiga. Ọ na-esi n’ụlọ ya pụọ, gaa ebe ọzọ nọọ ụbọchị ole na ole. Tutu ọ lọta, o nwere ihe a ga-eme ka ọgbanje ghara ịbanye nwaanyị ahụ n’afọ ọzọ.
Ọ bụkwa nkwenye ndị Igbo na onye abụghị ọgbanje ekwesịghị ịbụ enyi ọgbanje, maka otu ụbọchị enyi ya akpọbanye ya n’otu ọgbanje.
Odee: Somtochukwu Chiedu
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

