Akpaalaokwu bụ nkebiokwu nke nwere nghọta pụrụ iche. Onye amaghị Igbo nke ọma agaghị aghọta ihe a na-ekwu ma ọ bụrụ na e jiri akpaalaokwu gwa ya okwu. Ọ na-enwe nghọta abụọ, nghọta elu ya na nghọta omimi ya. Lee akpalaokwu ndị a na nkọwa ha.
| Akpaalaokwu | Nkọwa |
| 1. Obi kpọrọ Okwunna nkụ. | Okwunna anaghị emere mmadụ ebere. |
| 2. Ike na-eme aka abụọ. | Ike na-ezu ohi. |
| 3. Obinna kpụ okwu n’ọnụ. | O nwere ihe Obinna na-ekwu. |
| 4. O nwere ọnụ atụ | Ọ na-abụ o kwuo na ihe ga-eme, e mechaa ọ gaghị eme. |
| 5. O nwere ọnụ mpe. | Ọ na-akọrọ mmadụ ihe a chọghị ka a gwa mmadụ. |
| 6. Ọ dị ire abụọ | Ọ naghị ekwu eziokwu. |
| 7. Ọ na-agbọ ihe ewu na-ata | Ọ na-ekwu okwu na-abara mmadụ uru. |
| 8. Eluụwa na-ekwu ọnụ efu | Eluụwa na-ekwu okwu enweghị uru ọ bara. |
| 9. Ọ nwụ obu n’aka bịa | Ọ bịara n’ezigbo ụtụtụ. |
| 10. O siri ewu eri, ọkụkọ atụ | Nri o siri adịghị ụtọ oriri |
| 11. Ọrụ ahụ gbara ya mmiri. | Ọrụ ahụ tara ya ahụhụ. |
| 12. Ọ kpụchara iku anya | Ihere anaghị eme ya. |
| 13. Isi gbakara nwaanyị ahụ. | Ọ bụ onye ara. |
Nke a si n’agụmagụ mbido Igbo nke isii. Ọ bụ Prof Inno Nwadịke na ndị ozo deere ya.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

