Mmọnwụ

"Ndị Igbo kwenyere na mmọnwụ bụ mmụọ nna nna anyị ha nwụrụ anwụ, ndị na-abịa ka ha na mmadụ na-emekọ ihe n’ihe gbasara oriri na egwumegwu dị n’obodo. "
Ijele Painting
Ijele.

Ndị Igbo kwenyere na mmọnwụ bụ mmụọ nna nna anyị ha nwụrụ anwụ, ndị na-abịa ka ha na mmadụ na-emekọ ihe n’ihe gbasara oriri na egwumegwu dị n’obodo. N’ihi nke a, ugwu a na-akwanyere mmọnwụ na-adị ka nke mmadụ nwere ike ịkwanyere ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụrụ na ha apụta n’ihe. Nke a mere na a na-agbara mmọnwụ ọsọ maka na o kwesịrị na mmadụ ga na-atụ ndị mmụọ egwu.

Iti Mmọnwụ

E nwere ụdị mmọnwụ dị iche iche n’ala Igbo. Ụfọdụ bụ mmọnwụ ụmụaka, ndị ọzọ bụ mmọnwụ ndị okenye. Mmọnwụ ụfọdụ na-agba egwu, ndị ọzọ na-apịa naanị ụtarị. Ọtụtụ obodo na-eti mmọnwụ n’oge oriri dị iche iche, nke ka nke n’oge iri ji ọhụrụ. Ọsọ mmọnwụ na-achụ ụmụ agbọghọ so n’otu ihe na-enye ha obi aṅụrị n’emume ọ bụla.

Ụmụ nwaanyị adịghị eso eti mmọnwụ n’ọtụtụ obodo n’ala Igbo. Ọ bụ ụmụ nwoke ka iti mmọnwụ na-adịkarị. E ji mmọnwụ eme ka obodo na emume kpoo ọkụ.

Uru Mmọnwụ Bara

1. E ji mmọnwụ akwa ozu onye nwere agba ma ọ bụ ozu nwa okorobịa.

2. E ji mmọnwụ edozi esemokwu.

3. E ji mmọnwụ eme ka a ghara ịnwe mkpọtụ na nzụkọ.

4. E ji aha mmọnwụ eme ka nwata na-ebe akwa mechie ọnụ.

5. E ji mmọnwụ eme ka ụmụ nwoke na-eme isiike gbanwe.

Ọghọm Dị Na Mmọnwụ

1. Ụfọdụ mmọnwụ na-apịakpọ mmadụ anya.

2. Ụfọdụ na-akọ nsị

3. Ụfọdụ na-emerụ mmadụ ahụ.

4. Ụfọdụ mmọnwụ na-esi na ya megide onye ihe anaghị adabara ha abụọ.

N’oge gboo n’ala Igbo, naanị onye bara mmọnwụ nwere ike ịkwụ n’ihu mmọnwụ tuo ya aha.  A na-eti mmọnwụ, naanị ndị bara mmọnwụ nwere ike idufe ụmụ nwaanyị.

Odee: Chukwudị Okechukwu


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.