Akpaalaokwu

"Akpaalaokwu bụ nkebiokwu nke nwere nghọta pụrụ iche. Onye amaghị Igbo nke ọma agaghị aghọta ihe a na-ekwu ma ọ bụrụ na e jiri akpaalaokwu gwa ya okwu."

Akpaalaokwu bụ nkebiokwu nke nwere nghọta pụrụ iche. Onye amaghị Igbo nke ọma agaghị aghọta ihe a na-ekwu ma ọ bụrụ na e jiri akpaalaokwu gwa ya okwu. Ọ na-enwe nghọta abụọ, nghọta elu ya na nghọta omimi ya. Lee akpalaokwu ndị a na nkọwa ha.

Akpaalaokwu Nkọwa
1. Obi kpọrọ Okwunna nkụ.       Okwunna anaghị emere mmadụ ebere.
2. Ike na-eme aka abụọ.Ike na-ezu ohi.
3. Obinna kpụ okwu n’ọnụ.O nwere ihe Obinna na-ekwu.
4. O nwere ọnụ atụỌ na-abụ o kwuo na ihe ga-eme, e mechaa ọ gaghị eme.
5. O nwere ọnụ mpe.Ọ na-akọrọ mmadụ ihe a chọghị ka a gwa mmadụ.
6. Ọ dị ire abụọỌ naghị ekwu eziokwu.
7. Ọ na-agbọ ihe ewu na-ataỌ na-ekwu okwu na-abara mmadụ uru.
8. Eluụwa na-ekwu ọnụ efuEluụwa na-ekwu okwu enweghị uru ọ bara.
9. Ọ nwụ obu n’aka bịaỌ bịara n’ezigbo ụtụtụ.
10. O siri ewu eri, ọkụkọ atụNri o siri adịghị ụtọ oriri
11. Ọrụ ahụ gbara ya mmiri.Ọrụ ahụ tara ya ahụhụ.
12. Ọ kpụchara iku anyaIhere anaghị eme ya.
13. Isi gbakara nwaanyị ahụ.Ọ bụ onye ara.

Nke a si n’agụmagụ mbido Igbo nke isii. Ọ bụ Prof Inno Nwadịke na ndị ozo deere ya.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.