Nsọpụrụ Na Nrubeisi N’Ala Igbo

"Nsọpụrụ bụ mmadụ ịnye ndị okenye, ndị tọrọ ya, ndị echichi na ndị eze ugwu ruru ha. Nrubeisi abụrụ ịnwe obi umeala ma na-akwanyere ndị ị kwesịrị ịkwanyere ugwu. Nrubeisi na nsọpụrụ na-eweta ihe ọma na-emekwa ka udo dị. Ihe ndị a kacha dị mkpa na ndụ nwata."

Nsọpụrụ bụ mmadụ ịnye ndị okenye, ndị tọrọ ya, ndị echichi na ndị eze ugwu ruru ha. Nrubeisi abụrụ ịnwe obi umeala ma na-akwanyere ndị ị kwesịrị ịkwanyere ugwu. Nrubeisi na nsọpụrụ na-eweta ihe ọma na-emekwa ka udo dị. Ihe ndị a kacha dị mkpa na ndụ nwata.

Ndị Igbo na-atụ anya na nwata ga na-enye ndị tọrọ ya nsọpụrụ, na-erubekwara ha isi. Ya mere, nwata ekwesịghị ịkpọ onye tọrọ ya aha ya. Ọ bụrụ nwoke, o nwere ịkpọ ya “Nnaa.” Ọ bụrụ na ọ lụrụ nwaanyị mụta nwa, ọ kpọọ ya “Papa,” tinyezịe aha nwa mbụ ọ mụrụ. Ịmaatụ, “Papa Emeka,” maọbụ “Papa Ngọzi.” Otu a ka ọ dịkwa ebe nwaanyị nọ. Nwata kwesịrị ịkpọ ya “Nne,” maọbụ “Nne Emeka” maọbụ “Nne Ngọzi.”

Nrubeisi bụkwa mmadụ ịna-eme ihe ọbụla a gwara ya mee. Onye na-aṅ a ntị n’ihe a gwara ya na-aba uru na ndụ ya. Onye adịghị erube isi na-ezutekarị ọdachi, maka ijiji anaghị aṅa ntị na-eso ozu ala n’iyi. Ebe ọzọ mmadụ kwesịrị ịdị na-egosi nrubeisi na nsọpụrụ bụ n’ọgbakọ. Okenye maọbụ onye chiri echichi kpụrụ okwu n’ọnụ, onye nwere nsọpụrụ agaghị etinye ọnụ. Onye ọ bụla ga-anọ nwayọ ruo mgbe o kwuchara.

N’ala Igbo, ọ bụ ihe ziri ezi nwaanyị nọ na di, ịdị na-akwanyere di ya ugwu. Ọ teta ụra ụtụtụ, ọ kelee ya. Di ya richaa nri, ọ bịa buru efere. Nrubeisi anaghị anabata agwa ọjọọ maọlị. Onye na-erube isi anaghị etinye aka ya n’ihe ọjọọ dịka ịga ozi arụrụala na ozi na-ebute ọdachi. N’ihi ya, nrubeisi na-enye aka edozi obodo, ebe nsọpụrụ na-emekwa ka ezinaụlọ na-aga n’ihu.

Onye na-erube isi anaghị eme ihe n’efu. Tutu ọ mee ihe ọbụla dị mkpa, ọ na-ebu ụzọ jụọ ase. Ihe ọ jụtara n’ase ga-eme ọ maara ụzọ ọ ga-esi soo ihe ahụ. Ọ bụ ihe kwesịrị ka ụmụaka na-etolite etolite na-erube isi. Ọ bụ ihe jọgburu onwe ya ịhapụ nwata ka ọ mewe otu o si masị ya, maọbụ biwe ndụ ya dịka ndị Bekee. Nke a abụghị ezi ọzụzụ. Nne na nna, maọbụ ndị okenye na-eme otu a ahụghị nwata ahụ n’anya. Nwata ahụ tolite, ha ahụ na ọ gaghị na-ebi ndụ ya dịka ezi nwaafọ Igbo.

E kwesịrị ịzụ nwata ka ọ kwụrụ chị m, dịka otu omenala na ọdịnala Igbo siri dị.

Odee: Somtochukwu Chiedu


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.