Oge ọ bụla a kpọrọ ọfọ n’ala Igbo ihe na-agbata onye ọbụla n’uche bụ ndụ kwụ ọtọ. Ọfọ abụghị ihe a na-ekwu maọbụ kpọọ aha ebe ọbụla ihe ọjọọ dị maọbụ ebe a na-eme ihe ọjọọ, arụ arụrụala. Ọfọ bụ maka ndị na-ebi ezigbo ndụ. N’ala Igbo, e nwere osisi ọfọ. Ọ bụ n’ọhịa ka osisi dị otu a na-epu.
Ndị Igbo ejighị osisi ọfọ egwuri egwu, maka ha weere ya dịka osisi dị asọ. Ha wekwaara ya na osisi a ka osisi ndị ọzọ dị asọ. Ihe mere ndị Igbo ji akwanyere osisi ọfọ ugwu bụ na a naghị egbutu ya egbutu ka osisi ndị ọzọ. Alaka ya daa, ụmụ mmadụ atụtụrụ ya. Ọ bụkwazi mkpirisi alaka osisi a ka ndị Igbo na-eji n’aka.
A naghị anọ n’akụkụ maọbụ n’ukwu osisi ọfọ akpara mmadụ nkata ọjọọ. Nke a bụ maka ugwu a na-akwanyere osisi ọfọ. Mgbe alaka osisi ọfọ dara n’ala, a na-ewere ya tinyer n’ọkwa dị asọ. Ọ bụkwa okenye maọbụ onye echichi na-akwụba aka ya ọtọ na-edote ya. N’oge ochie, a na-eji ọjị na ọkụkọ were eme omenala banyere ọfọ. A na-ekwu okwu dị ire, gbukwaa ọkụkọ. E mesịa, ọfọ ahụ amalite rụwa ọrụ dịkwa ire.
Ihe dị mkpa ịrụtụ aka bụ na ọ na-abụkarị ọfọ obodo maọbụ nke ụmụnna ka a na-akwado otu a. Ọ bụ maka ụdịrị ugwu a a na-akwanyere ọfọ mere e ji aza aha dị iche iche dịka Ọfọma, Jideọfọ, Nsọfọ wdgz. Ndị Igbo ji ọfọ eme ọtụtụ ihe dị oke mkpa dịka ịgụ nwa aha, tinyere ịlụ nwaanyị.
E mecha ihe ọbụla a na-eme n’ime emume ndị a, a na-eti ọfọ n’ala wee kachie ya. Onye ọbụla ga-ekwenyekwa na ihe ga-aga dịka e si kwuo ya. Ndị Igbo anaghị eji ọfọ n’aka oge niile. N’agbanyeghị, uche ha na-adị n’ọfọ ha. Ọ bụ nke a mere a na-agọ ọfọ, e kwuchaa ihe dị na ya, mmadụ dum etie ọfọ oo!
Onye ọjọọ nwere uche anaghị emetụ ọfọ aka. Ọ naghịkwa aza ya n’aha maọbụ gụọ ya nwa ya.
Odee: Somtochukwu Chiedu
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

