Ịgba Mgba N’Ala Igbo

"Ịgba mgba bụ nnukwu ihe n’oge gboo. Ndị ochie ejighị ya egwuri egwu. Ọ bụ ihe e ji ama nwoke ahụ gbasiri ike. Ụfọdụ mgbe o nwere ụmụnwoke na-akwụ ụdọ ma e merie ha na mgba n’oge gboo. Ndị Igbo na-amalite n’oge kụziwere ụmụ ha mgba."

Ịgba mgba bụ nnukwu ihe n’oge gboo. Ndị ochie ejighị ya egwuri egwu. Ọ bụ ihe e ji ama nwoke ahụ gbasiri ike. Ụfọdụ mgbe o nwere ụmụnwoke na-akwụ ụdọ ma e merie ha na mgba n’oge gboo. Ndị Igbo na-amalite n’oge kụziwere ụmụ ha mgba. Ụmụaka nọrọ n’ama egwuregwu, ndị tọrọ ha tinyere ndị okenye apụta ịnara ikuku mgbede na-akụziri ha mgba.

N’oge gboo, e nwere obodo na-eme omenala ịga mgba nwadiala. Nke a bụ ịga ikwu nne ya gbaa mgba. Mana nke zuru Igbo niile ọnụ bụ obodo ibugara obodo ọzọ mgba. Ọ bụ ụdịrị a ka Chinụa Achebe rụtụrụ aka n’akwụkwọ ya ọ gụrụ Ihe Aghasa(Things Fall Apart) banyere mgba Okonkwọ na Ọmalinze.

A na-enwe onyeisi mgba. Ọ bụ ya na-edu ndị ọzọ jee mgba. Ha na-aga, ndị egwu ha esoro ha. E ruo na-agba mgba, ndị egwu ana-etiri ha egwu. Ndị na-ajasi ha ike anọrọ na-etu ha aha, na-asịkwa ha jisie ike. Mgba nọ ọnọdụ ihe bọọlụ dị ka ya ugbua n’oge gboo.

N’Afikpo, e nwere ụzọ mgba atọ. Nke mbụ bụ nke ụmụagbọghọ. Ụmụagbọghọ na-agba mgba a ka ha nweta ugwu. Nke a na-enye aka, ha alụta ezigbo di. Maka nwoke na-alụ ha na-enwe aṅụrị na ọ bụ nwunye ya kacha ibe ya ike. Ụdịrị mgba ọzọ n’Afikpo bụ mgba ndị nne nwaanyị. Ọ bụ ndị bịara di ọhụrụ na-esonye na ya.

Nke atọ bụ mgba ụmụnwoke. Nke a bụ oke mgba n’Afikpo. Ugwu ha na-akwanyere ya mere e ji akwado ya ọfụma kwa afọ abụọ ọbụla. Ọ bụ ụmụaka na-amalite mgba ụbọchị e nwere mgba. Mana a naghị eche ka ha gbachaa, maka ọ na-atọkọrọ ha. Ọ bụ n’ihi ya mere e nyetụ ha oge ka ha gbaa, ha achaa n’akụkụ.

A gbakaata mgba, ndị bịara chọwa ịla, onyeisi mgba obodo ahụ ga-apụta n’ọgbọ mgba ahụ wụlie aja elu. Ozigbo nke a mere, ndị bịara mgba eburu egwu ha soro ndị otu ha tiri ya lawa.

Odee: Somtochukwu Chiedu


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.