Ihe Mere E Ji Ele Nwaanyị Ọmụgwọ N’Ala Igbo

"Ya bụ ile nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọmụgwọ dị ka ịna nwaanyị n’aka, iti ya aka n’obi nakwa ile ya ọrụ makana ọ bụ onye rụrụ oke ọrụ ka a na-ele ọrụ."
Ihe Mere Eji Ele Nwaanyi Omugwo

Ọ baghị uru ịjụ ihe mere e ji ele nwaanyị mụrụ nwa ọmụgwọ n’ala Igbo. Ịjụ ajụjụ dị etu a yiri ebe a jụrụ onye gburu agụ ihe o ji aza ogbuagụ. Igbo niile kwenyere na a rụchaa n’anwụ, e rie na ndo. Ya bụ, ile ọmụgwọ dị ka ile nwaanyị ọrụ makana ọ dịghị mfe isi n’elu ugwu rịdaa.

Nwaanyị mụrụ nwa dị ka onye gara ala mmụọ lọta na ndụ. Ị lee anya n’ọtụtụ akụkọ ifo ala anyị, anyị ga-ahụ na onye ọbụla gara ala mmụọ lọta, a na-ana onye dị etu a n’aka n’ụzọ pụrụ iche. Ya bụ ile nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọmụgwọ dị ka ịna nwaanyị n’aka, iti ya aka n’obi nakwa ile ya ọrụ makana ọ bụ onye rụrụ oke ọrụ ka a na-ele ọrụ.

Ihe ndị mere e ji ele nwaanyị mụrụ nwa ọmụgwọ

Nke mbụ bụ, ile nwaanyị mụrụ nwa ọmụgwọ bụ ụzọ e si asị nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ nnọọ n’ogologo ije ọ gara n’ọnwa iteghete zuru oke maọbụ karịa.

Nke abụọ, ile nwaanyị ọmụgwọ bụ ụzọ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ si erichi ahụ n’ọbara niile ndị ahụ, na ihe na-eso nwa si ya n’ahụ pụta, na kwa ike na ume bụ ihe ndị pụrụ ya n’ahụ mgbe ọ na-amụ nwa. Ihe ndị a na-esi n’ahụ nwaanyị mụrụ nwa apụta, na-eme ka nwaanyị mụrụ nwa dị ka akpa a wụpụrụ ihe.

Ọ bụ ya mere nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ji eri ihe dị iche iche gụrụ ya dịka akpụ, ji, ụtara ji, ofe nsala, azụ, anụ, okporko, wdgz.

Nke atọ, ile nwaanyị ọmụgwọ bụ ụzọ e sikwa asị nwa bịara ụwa nnọọ. Mgbe a na-ele nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọrụ ka a na-ele nwa ọhụrụ n’aka nke ya. Nne na-eri ihe ndị a na-esiri nwaanyị nọ na ọmụgwọ, nwa ọhụrụ a na-aṅụrụ n’ara.

Nke anọ, ile ọmụgwọ bụzikwa ụzọ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na nwa a mụrụ ọhụrụ si enweta onyinye dị iche iche. Mgbe nwaanyị mụrụ nwa, ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa eleta ya na nwa.

Nke ise, ile nwaanyị ọmụgwọ bụ ụzọ e si elezi ma na-emezi ahụ nwa a mụrụ ọhụrụ iji mee ka ọ dị etu o kwesiri, ma zuo oke dịka nwa nwoke maọbụ nwa nwaanyị. Nke a na-apụta ihe n’ibi ugwu nakwa etu e si emezi ahụ nwa nwaanyị amụrụ ọhụrụ ka aghara ịnwe ọghọm ọbụla n’ọdịnihu.

N’eziokwu, e wezuga ọmụgwọ dịka otu n’ime omenaala e ji mara ndị Igbo, ọtụtụ ndị gaara adị ka ndị n’ezughị oke. Ma ekele dịrị ọmụgwọ na mmiri ọkụ e ji eme ka ahụ mmadụ dị etu o kwesịrị, Ọzọkwa, ile ọmụgwọ bụ ụzọ pụrụ iche nne mụrụ nwaanyị nọ n’ọmụgwọ ji eleta nwa ya nwaanyị anya, nakwa ịmata etu ya na di ya si ebi.

Ọ bụkwa ụzọ e si akwanyere nne nwaanyị nwa ya mụrụ nwa ugwu, dịka onye mụtara nwa nwaanyị ahụ zuru oke. N’ikpeazụ, ile nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ ọmụgwọ so n’otu omenaala ndị Igbo gbakwasịrị ụkwụ ịleta nwa ọhụrụ na nne ya anya nke ọma. Maka nwa bụ akụ, nwunye mmadụ bụkwasị ihe e ji ama nwoke isi kpakọrọ ọnụ.

Odee: Osinakachukwu Onyemaechi


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.