Ọmụgwọ N’Ala Igbo

"Ọmụgwọ bụ ezumiike nwaanyị mụrụ nwa na-ezu iji nweta onwe ya n’ahụhụ niile ọ hụrụ n’ime ọnwa iteghete o jiri buo nwa n’afọ, ime mere ya, ọchịchị ọ chịrị nwa na kwa, ịmụ ya."
Omugwo

Ọmụgwọ bụ ezumiike nwaanyị mụrụ nwa na-ezu iji nweta onwe ya n’ahụhụ niile ọ hụrụ n’ime ọnwa iteghete o jiri buo nwa n’afọ, ime mere ya, ọchịchị ọ chịrị nwa na kwa, ịmụ ya. N’oge a, a na-elezi nwaanyị mụrụ nwa anya nke ọma, n’ihi na e kwenyere na nwaanyị mụrụ nwa mere oke ihe. Ụfọdụ na-ahụ ya dịka onye rịrị ugwu mmụọ, na ugwu mmadụ, ebe ndị ọzọ na-ahụ ya dịka onye si n’elu ugwu rịdata.

N’ihi nke a ka e ji ekele nwaanyị ọbụla mụrụ nwa nnọọ, maka njem o si ebe dị anya lọta. Ọzọkwa, ụfọdụ chọwa ịjụ ma nwanne ya dị ime ọ mụọla nwa, ụzọ  a ga-esi kwuo ya bụ “ọ rịtugo.” Ya bụ mgbe ọbụla nwaanyị mụrụ nwa na-ezu ike, n’emeghị ihe ọ bụla, kama a na-elezi ya anya na-emere ya ihe ọ chọrọ. Nke a bụ ọmụgwọ.

N’oge a, ọ dịghị arụ ọrụ ọbụla maka ike adịghị ya, naanị ịrahụ ụra na ịnye nwa ara bụ ọrụ ya. Ọ ga na-eriju afọ ka o wee gbasịe ike n’ihi na ọtụtụ ihe pụrụ ya n’ahụ. Ọzọkwa, ọ bụkwa ihe gụrụ ya ka ọ ga na-eri iji mee ka ọ laghachite otu ọ dị tupu ọ mụọ nwa. Ihe na-apụ nwaanyị n’ahụ abụghị obere ihe, ma ọbara, mmiri, ume, ike. Ihe ndị a na-eme ka nwaanyị tọgbọrọ dịka akpa awụpụrụ ihe.

Iji mee ka ọ nwetakwa onwe ya, nwaanyị mụrụ nwa na-eri akụ n’ọnụ. Ọ bụ ya mere tupu nwaanyị amụọ nwa, maọbụ ọ mụchaa nwa, di ya na-azụrụ ya anụ, azụ, ọkachasi okporoko. Anụ ọkpọọ anaghị akọkwa na ngịga. Ụfọdụ na-egburu nwunye ha ọkụkọ maọbụ ewu dịka etu aka siri dị onye.

Ọ bụ ya mere e ji ahụ ọmụgwọ dịka oge oriri na oge ezumike nwaanyị mụrụ nwa. Ihe nkọwa a na-ezipụta bụ na ọ bụ nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-anọ ọmụgwọ. Ọ bụghị naanị sọ nwaanyị ka a na-eleta. Nne ya na ndị na-eleta ya sokwa eri ihe nwaanyị mụrụ nwa na-eri, dịka ịṅụ mmiri ọkụ e ji azụ, ụda na ụzịza wee tee, makana a sị na ogbu ọja na-ehicha imi. Nwa na-eketakwa oke nke ya site n’ịṅụ ara, mbitu aka, na ekpere a na-ekpere nwaanyị nọ na ọmụgwọ. Nke a na-egosi na nwaanyị nọ na ọmụgwọ na-anata onyinye dị iche iche n’aka ndị na-abịa eleta ya na nwa ọhụrụ ọ mụrụ.

Ọ bụghị sọ nwaanyị mụrụ nwa ka a na-enye onyinye kama ọ na-erute nwa a mụrụ ọhụrụ. Ọ bụ ya mere ọtụtụ mgbe onye nyere nwaanyị mụrụ nwa ego na-asị ya were nke a zụtara nwa nke a, maọbụ nke ọzọ. Nwaanyị mụrụ nwa na-enyekwa ha nzu bekee bụ pawụda ha na-ete. Ụfọdụ oge, nna nwe ụlọ na-eweta ọjị, aṅara, oseọjị maọbụ mmanya ọbụla lee ha ọbịa.

Odee: Osinakachukwu Onyemaechi.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.