
Mgbe ọ bụla a mụchara nwa, ihe di na-alụ nwaanyị mụrụ nwa ga-eme bụ ịga kpọọ ọgọ ya nwaanyị maọbụ nne nwunye ya maka ịbịa lee nwa ya ọmụgwọ. A sị na osi n’ekwu na-ama nkụ na-enwu ọkụ maka a naghị agwa ya ka e si eji akwụ etinye n’ọkụ. Nne nwaanyị na-abịa ịle nwa ya ọmụgwọ amarala ihe dị iche n’ụda ikwe na nke ekwe, maka onye bụ ụzọ siwe ite, na-ebu ụzọ enwe mkpọmkpọ ite.
Dịka nne, ọ marala ihe e riri na ihe a gbọrọ n’ile ọmụgwọ. Ọ bịawa ije a, ọ na-azụta ihe ndị ọ ma dị mkpa e ji esiri nwaanyị mụrụ nwa nri dịka azụ ọkpọọ, ayịya, managala, okporoko, ụzịza na kwa ụda. Ọ nwekwara ike ịweta ose, nnu, mmanụ nri, egwusi, abacha, akpụ, ogiri na akwụkwọ nri ndị ọ chọrọ ibukọta wee bịawa ije ahụ.
Ọ bụ izu asaa ka ọ ga-anọ lee nwa ya nwaanyị ọmụgwọ. N’ihi ya ka o ji kwado onwe ya nke ọma n’ihe oriri.
Ọrụ Nne Nwaanyị Mụrụ Nwa Na-Arụ N’Ọmụgwọ.
Ọrụ dịịrị nne nwaanyị ọbụla bịara ile nwa ya ọmụgwọ gụnyere:
a. Isiri nwa ya na di ya nri.
b. Isi mmiri ọkụ e ji asa nwaanyị mụrụ nwa na nwa a mụrụ ahụ.
Ch. Ịsa nwa ya nwaanyị na nwa ya ahụ.
d. Ịsa akwa.
e. Ịleta nwaanyị mụrụ nwa na nwa ya anya, ọkachasị n’oge abalị. Nkọwa nke a pụtara ịmụ anya abalị.
N’eziokwu, ịle ọmụgwọ abụghị bịa rie bịa ṅụọ, kama ọ bụ bịa rụọ. Nne nwaanyị na-abịa ọmụgwọ na-eke ajị n’ume n’ihi na ha na-amụ anya abalị n’ime izu asaa ahụ e ji anọ na ọmụgwọ. N’ime imu anya abalị a ka a na-eledo nwa ọhụrụ anya, ịma ka o siri nọrọ. Ikuru ya mgbe ọ bụla o bewere akwa, iji mee ka nne ya hie ụra nke ọma.
N’ime nke a, ọ ga-ahụ na ọkụ na-enwu n’ụlọ ebe nwa ọhụrụ na-edina. Nke kachasị bụ ịkụziri nwa ya ihe dị na nwa a mụrụ ọhụrụ.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

