N’ụbọchị taa n’afọ 1911 ka a mụrụ odogwu a. Na ndụ ya, Ọsadebe gụrụ akwụkwọ nke ọma, mechaa bụrụ ọkaikpe. O sokwa guzo patti “National Council of Nigeria and the Cameroons” n’afọ 1944.
Dennis dịka onye nwere mmasị pụrụ iche na-ịdee abụ(Poetry) na Bekee sokwa kwalite nke a, n’ala anyị.
Ọ kpọkwara ojoro nke dị na “Party Politics” asị. Ya mere ebumnobi ya oge ọ banyere “Politics” bụ naanị ihe ga-akwalite obodo.
Dịka onye maa ihe ekwe na-akụ gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ bụkwa ya bụ onyeisi “Nigerian Senate” n’afọ 1960, mechakwa bụrụ “Premier Mid-Western Region” nke mbụ n’afọ 1963.
Ọ zara oku ọnwụ n’ụbọchị 29 Disemba n’afọ 1994.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.


