Ncheta Augustine Ilodibe na Akanụ Ịbịam

N’ụbọchị taa n’afọ ndị gara aga, ka ndị odogwu a zara oku ọnwụ. Ilodibe nwụrụ n’afọ 2007, ebe Akanụ Ịbịam nwụrụ n’afọ 1995.

Na ndụ ha biri, Augustine Ilodibe bụ nwa afọ Nnewi, maa bụrụkwa onyeisinchọpụta nnukwu ụlọọrụ maka njem bụ Ekenedilichukwu, nke o guzoro n’afọ 1955.

Akanụ Ịbịam n’aka nke ya bụ onye Afikpo, maa bụrụkwa dibịa Bekee. Dịka onye kwụbara aka ya ọtọ, o weghachiri echichi “Knight” nke ndị mba Briten maa jụzịa ị zaa aha Bekee ya bụ “Francis” ọzọ, maka ukwu ha dọnyere ndị Naịjirịa n’agha Biafra.

Kaa mkpụrụ obi ha abụọ gaa n’ihu na-ezu ike n’udo.

Amen!


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.