N’ọnwa a, na afọ 2018 ka Uche Ọnwụamaegbu-Ugwu kpọọ ụmụ nwaanyị ise ndị a: Jessica Osita, Promise Nnalue, Nwabụakụ Ossai, Adaeze Ọnụigbo na Vivian Okoye wee gaa Silicon Valley na mba Amerịka.
N’ebe a, ka ụmụada ndị a gosiri ụwa dum na ha nwere isi ọma, maa marakwa ihe ekwe na-akụ na “Technology.” Nke a mere ha ji bụrụ ndị gbara ndị nke mbụ na asọmpi ha soo ụmụ akwụkwọ si mba dị iche iche wee zọọ, maka ị wepụta “App.”
Ebumnobi ha mgbe ha rụrụ “App” ha bụ ka ọ nyere aka kwụsị ọgwụ adigboroja dị n’ala anyị bụ Naịjirịa. Ọzọkwa, meri ha gosiri na kọrịkulum anyị ji akụziri ụmụaka anyị akwụkwọ agaghị e nyere ha aka kwụrụ chị m n’ebe ndị ọgbọ ha si mba ofesi dị iche iche nọ.
Mana ọrịa anyị na-arịa n’ala anyị, amaghị ọgwụgwọ ya bụ, anyị mara ihe ga-enyere obodo aka kwetasịa n’anyị ga-eme ya. O ruo n’omume, akụkọ a rịwa ibe ya elu.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.




