N’ụbọchị taa n’afọ 1983 ka Kenneth Ọnwụka Dike zara oku ọnwụ. A mụrụ ya n’ụbọchị iri na asaa n’ọnwa Disemba n’afọ 1917. Ọ bụ onye Ọka na Anambra Steeti. Kenneth gụrụ akwụkwọ Sekọndịrị na DMGS, Ọnịcha.
Ọ mechara gawara mba Briten maka B. SC ya na mahadum Durham. O sochiri nke a mgbe o nwetara nzere M.A na mahadum Aberdeen. Dịka onye nwere mmasị pụrụ iche n’akwụkwọ, ọ gakwara n’ihu nwetakwuo Ph.D na ngalaba History na mahadum London.
Kenneth Dike ji akwụkwọ ya: “Trade & Politics in the Niger Delta” nke ọ deere n’afọ 1956 wee kọwaa otu mba Briten si wee were nwayọ ghasaa ọchịchị n’ala anyị. E mere ya onyeisi(Vice Chancellor) mahadum Ibadan nke ọ bụ, bido n’afọ 1960 ruo afọ 1966.

Nke a mere ya nwa afọ ala Naịjirịa mbụ bụ onyeisi mahadum n’ala anyị. Mana oge agha Biafra malitere, Kenneth chiliri aka elu n’ọkwa a. Ọ lọtara ala Igbo wee kwadosie mbọ ụmụ Igbo ịnwere onwe ha n’aka ndị Naịjirịa.
Ọ gakwara mba Amerịka, ebe ọ nọ kwuo hoo haa n’ụwa dum kwesịrị ịkwado Biafra ka ha nwere onwe ha. Ka ndị Biafra chiliri ndị Naịjirịa aka elu n’agha, o wutere odogwu a nke ukwuu. Ọ gawara mahadum Harvard ka nke a mesịrị. Ebe a ka e mere ya onyeisi na “African Studies” bido n’afọ 1971 ruo afọ 1973.
Ọzọkwa, mahadum Harvard mere ya “Professor” nke African History n’afọ 1973. Mgbe ọ lọghachiri ala Igbo, e mere ya “President” mahadum nke Anambra Steeti.
Ọ zara oku ọnwụ n’otu ụlọọgwụ dị na Enugu Steeti n’ụbọchị taa, n’afọ 1983. Ọ gbara afọ iri isii na ise oge ọ nwụrụ. Chineke jikwa ụmụ ise wee gọzikwa ya na nwunye ya bụ Ọna.

Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

