Tony Ubesie Cover - Mbido Igbo

Ncheta Ọmụmụ Tony Ubesie

Febụwarị 22

N’ụbọchị taa n’afọ 1950 ka a mụrụ odogwu nwoke a. Na ndụ ya, Tony kpara ike dị egwu na ịdee akụkọ e roro ero site na nghọta omenala Igbo. O gosiri na nwa afọ Igbo ekwesịghị ịghọ obodo ahịa na Jụọ Obinna(1977).

Na Isi Akwụ Dara N’ala(1973) ka o gosiri na nwoke ọ bụla kwesịrị ịhịị asaa n’anya tutu ọ lụọ nwaanyị. Ọ megidere ohi na Mmiri Ọkụ E ji Egbu Mbe(1974). Na Ụkpaka Mịịrị Onye Ụbịam ka ọ rụtụrụ aka ọghọm dị na nna ịkwanye nwa ya nwaanyị ịlụ di nwere ego.

Mana ọ mesịrị ka anyị mata na ịhụnanya karịsịrị na Ụkwa Ruo Oge Ya Ọ Daa(1973). N’ezie, anyị ga-eleba anya ị wepụta ụbọchị taa ka ọ bụrụ ụbọchị Tony Ubesie n’ala Igbo. Daalụ nnụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.