Ngwụcha Agha Biafra

Ndị Chi Mere Eze
FB IMG 1610457484441

N’ụbọchị taa n’afọ 1970 ka agha Biafra biri. Onyeisiala Naịjirịa bụ Gowon kwuru na o nweghị onye meriri n’agha ahụ. Mana ụdịrị agwa ndị Naịjirịa malitere kpasowa ụmụ Igbo gosiri na ọchị dị ha n’eze, mana iwe dịkwazị ha n’obi.

Ego niile ndị Igbo nwere n’ụlọakụ, ma ọ dị nnukwu, ma ọ dị ntakịrị, ma ị bụ  onye ukwu, ma ị bụ onye nta, naanị puku iri abụọ ruru onye ọbụla aka n’otu n’otu. A naghị ekwuzị ihe ụnwụ, mbibi, na ọnwụ nke agha butere wee kpochapụkwa ihe karịrị nde mmadụ abụọ.

Nke kachaa agbawa obi bụ na ọtụtụ ụmụaka so na ndị nwụrụ. Ụfọdụ n’ime ha bụ agụụ menyụrụ ha anya, ebe ndị ọzọ bụkwazị ọrịa dulara ha mmụọ. Mana n’agbanyeghị ọdachi ndị a niile, nd Igbo maara nke ọma na ọ bụ onye kwe, chi ya ekwe, maka onye a jụrụ anaghị ajụ onwe ya.

Site na ntụ na mbibi agha Biafra ka ndị Igbo si wee gbawara onwe ha mbọ. N’ụbọchị taa, o nweghị ka a ga-esi gụwa ndị ọgaranya n’ala anyị bụ Naịjirịa ma ghara ọtụtụ ndị Igbo. Nke a bụ maka na ndị Igbo abụghị ndị ụjọ nke ha ji bụrụ ndị umengwụ, maka na ngana tọọ ute, agụụ ekpughe ya

O nweghị ọrụ maọbụ ahịa uru dị n’ime ya, ha anaghị etinye isi, n’agbanyeghị ihe mmekpa ahụ so ya. Maka na ụzọ etegbuola onwe ya n’aka bụ na a malitebeghị njem. Na nwa mgbeke amaghị akpụ isi bụ na agụba adịghị nkọ.

Nke a bụ akala aka, bụrụkwa onyinye Chukwu nyere ụmụ Igbo mere ha ji bụrụ agbụrụ pụrụ iche na ndị ojii dum.

Daalụ nnụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.