Ncheta Ụbọchị Ọmụmụ Flora Nkiru Nwapa

Agbara Nwaanyị
20210111 174744

N’ụbọchị taa n’afọ 1931 ka a mụrụ Flora Nwapa. Na ndụ ya, ọ bụ onye Oguta nke dị n’Imo Steeti. Flora bụ nwa mbụ n’ụmụ isii, nne na nna ya mụrụ. Ọ gara akwụkwọ Sekọndịrị n’Elelenwa nke dị na Port-hacourt, mechazịa gaa mahadum Ibadan n’afọ 1957. Ebe a ka o si gaa nweta nzere n’ihe ọmụmụ “Education” na mahadum Edinburgh, Scotland.

Ka ọ lọtara ala nna ya, ọ rụrụ ọrụ na “Ministry of Education” dị na Calabar, si ebe ahụ gaa kụzie asụsụ Bekee n’ụlọakwụkwọ Queens dị n’Enugwu, malite n’afọ 1959 ruo afọ 1962. Ọ rụkwara ọrụ n’ebe dị iche iche dịka mahadum Lagos na Alvan Ikoku College of Education.

Mgbe agha Biafra bịara n’isi njedebe, Flora nyere ụmụaka ndị nwa enwe nne, enwe nna aka, ma mee ka ọnọdụ ha gbanwee. Mana ọ bụ n’ide akwụkwọ ka aha ezi nwaada a ji gbasaa n’ụwa dum.

Ọ dere “Efuru” nke e bipụtara n’afọ 1966. Nnukwu odee bụ Chinụa Achebe nyonyekwara anya n’akwụkwọ ahụ n’afọ 1962 wee kwuo na ọ kwụ chị m, tutu e bipụta ya. O dekwara ọtụtụ akwụkwọ ndị ọzọ dịka Idu(1970), Never Again(1975), One is Enough(1981) na Women Are Different(1986).

N’afọ 1974, Flora bụ nwaanyị mbụ n’ala anyị bu ụzọ hibe ụlọọrụ na-ebipụta akwụkwọ nke ọ gụrụ “Tana Press.” Flora si n’akwụkwọ ya mee ka ụmụnwaanyị mata na ha nwere ike ịbụ mmadụ site na mbọ ha gbaara onwe ha.

Ihe agbara nwaanyị a mere dị ọtụtụ. N’ihi ya, e chiri ya Ogbuefi n’afọ 1978, n’agbanyeghị na ọ bụ nwaanyị. Ọ zara oku ọnwụ n’ụbọchị iri na isii, n’ọnwa Ọktoba n’afọ 1993. Ọ gbara afọ iri isii na abụọ oge ọ nwụrụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.