
Ikwe n’aka bụ otu ụzọ ndị Igbo si na-ekele mmadụ n’ala Igbo. Ndị Igbo na-ekwu okwu sị, ekele dịwa ụtọ, ekwewe n’aka. Ikwe n’aka miwe emi, e biwe ọma. Na mgbe gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, mgbada chezọ onwe ya, akpụkpọ ya ekoro na be dinta. Mgbe ahụ, dike ehighị aka abụọ n’anya, nwoke ibe ya ewere isi ya zaa ikoro; n’ezie o nweghị onye ji ndụ ya n’aka.
Niihi ya, nwoke ọ bụla tozuru etozu si be ya bilie, o turu mma ya n’ukwu, makana nkwụcha abụghị ụjọ. A maghị ma aga ezute enyi, ma ọ bụ onye iro n’ụzọ. Odogwu nwoke zute ibe ya n’ụzọ, ha ewere akanri kwee onwe ha n’aka.

Ọ bụ n’ukwu akaekpe ka ndị Igbo na-etunye mma, nke pụtara na ọ bụ akanri ka e ji amịpụta ya. Odogwu zute ibe ya n’ụzọ, kwee onwe ha n’aka nke ọma, o woo ha anya na o nweghị onye ga-eji akaekpe mịpụta mma ya. Ha abụọ agafee n’udo. Ndị Igbo bụ ndị amara nke ọma ji ọjị anabata ọbịa. Ma ha na-aga n’ụzọ, o nweghị otu ha ga-esi were ọjị kpagharịwa, tinyere na ha nwere ike zute ọtụtụ mmadụ n’ụzọ.
Ọ bụ ya mere ha ji ata ọjị aka, nke bụ ikwe n’aka. Ndị mmadụ taa ọjị aka, a mara na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla mmadụ ga-eme ibe ya ma onye ahụ gbakụta azụ; ọ nọchiela anya ọnọdụ ịta ọjị. Ọzọkwa, n’oge gboo, mmadụ na-atọrọ ibe ya ree. Ma mmadụ na ibe ya taa ọjị aka, obi esiela ha ike na o nweghị onye ga-esi n’azụ tọrọ ibe ya je ree.
Ikwe n’aka nwere nnukwu omimi n’ala Igbo. N’oge gboo, naanị onye mere ihe ike dị ka igbu agụ, igbu ọdụm, igbu atụ, wdgz, ka a na-ekwe n’aka. Nke a mere na ndị mmadụ ji ya ama njakịrị ma mmadụ jụọ ibe ya ihe mere na o kweghị ya n’aka. Ọ zaa ya sị, “a na m ekwe gị n’aka, ị gburu agụ ka ọ bụ ị gburu atụ?”
Ọ bụ niihi ya ka ọtụtụ ndị okenye anaghị ekwe nwaanyị n’aka, maka na nwaanyị ekwesịghị ikwe n’aka. Nwaanyị ekwesịghị ịkpa ike. Nwaanyị kpaa ike n’ala Igbo, a hapụ nne nwaanyị o kwesịrị ịbụ kpọwa ya oke nwaanyị. Nwaanyị mee ihe ike n’ala Igbo, a naghị ewere ya na ọ bụ ezigbo ihe ka o mere. Ọ bụ arụ, maka ọtụtụ ihe ike bụ nwoke chara acha ka ọ dịịrị.
N’ikpeazụ, ikwe n’aka na-abụkarị ka ahụ na ahụ metụ, nke bụ ugwu ka ị kwanyeere onye ahụ i kwere n’aka, maka na ọ bụghị onye ọ bụla mmadụ kelere ekele ka o nwere ike ikwe n’aka. Mmadụ anaghị ekwe onye bu ajọ ọrịa n’aka. Na mmadụ kwere ibe ya n’aka gosiri na onye ahụ anaghị enyo onye o kwere n’aka enyo na o bu ajọ ọrịa na-efe efe.
E jikwa ikwe n’aka na-egosi onye ọbịa na a nabatara ya n’ebe ọ bịara.
Nke a si n’aka n’akwụkwọ ọdịnala ndị Igbo nke Maazị Tony Ubesie deere.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

