
N’ụbọchị taa n’afọ 1962 ka a mụrụ Stephen Keshi. Na ndụ ya, a mụrụ ya na Azare, Bauchi Steeti, ma ọ bụ onye Illah nke dị n’okpuru ọchịchị Oshimmiri North, Delta Steeti. Keshi gara akwụkwọ Praịmarị na Apapa, Legọs Steeti, mechaa gaa St. Finbarrs’ College dị na Akoka n’otu Legọs ahụ.
Ọ gbara Naịjirịa bọọlụ malite n’afọ 1981 ruo afọ 1995. Ọ bụkwa ya bụ Kaptịn ndị Super Eagles oge ha butere kọọpụ “African Cup of Nations” na mba Tunisia n’afọ 1994.

Ka Keshi lara ezumike nka na bọọlụ, ọ gara mba Amerịka ebe ọ malitere ọzụzụ ịbụ “coach” ndị bọọlụ. Uchu o tinyere na nke a mere o ji kwụrụ chịm oge ọ mechara. Mgbe ọ malitere ọrụ, o doro ewu na ọkụkọ anya na ọ maa ihe ekwe na-akụ.
Dịka “coach” ndị Togo, o mere ha e merie ndị bọọlụ dum ha na ha gbara na Afrịka, ma sonye n’asọmpi iko mba ụwa n’afọ 2006. Nke a bụ mbụ ha sonyere ruo taa. Ọzọ dịka ibe ya, oge ọ bụkwa “coach” nke Super Eagles, ọ kpọrọ ha gaa bute iko “Afcon” n’afọ 2013.

Odogwu a mechara bụrụ “coach” si mba Afrịka du obodo abụọ gaa zọọ iko mba ụwa, mgbe ndị Super Eagles merichara, ma nweta ikike ị gaa mba Brazil n’afọ 2014. Keshi lụrụ Kate, maka ihe nwoke ruru ogo ya a bụghị ụsa. Alụm di na nwunye ha nọ afọ iri atọ, tutu ọrịa cansa e dulagaa Kate mmụọ n’afọ 2015.
Ọ teghị aka e ruchara ụjụ Kate, chi e werekwa ehihie jie n’ụbọchị asaa n’ọnwa 2016 mgbe Keshi nwere ọrịa nkolopụ obi na Benin. Ndị nọ nso gbalịrị maburu ya gawa ụlọọgwụ, mana ọkụ odogwu a menyụrụ n’ụzọ. Ọ gbakwara afọ iri ise n’anọ oge ọ nwụrụ.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

