Ọmụgwọ

20210109 164519

Ọmụgwọ bụ ọnọdụ ezumike na nkwari akụ nke nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-enwe. Ọ bụ izu asaa ma ọ bụ abalị iri abụọ n’asatọ ka nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ na-anọ na ọmụgwọ. Nne nwaanyị ahụ mụrụ nwa ọhụrụ ga-abịa na-esiri ya ihe ahụ ya chọrọ.

Ọ ga na-ebikwa ya mmiri ọkụ na-akọwakwara ya ụfọdụ ihe ọ maghị dịka onye mụrụ nwa ọhụụ. Mgbe ọ bụla a mụrụ nwa ọhụụ, obodo niile na-ejupụta n’ọṅụ, maka ndị Igbo kwenyere na nwa bụ nke ọha. Ụmụ nwaanyị ga na-agba egwu, ebe aga-eji uhie ọcha(Powder) wee wụọ nna mụtara nwa ahụ.

Nne nwaanyị mụrụ nwa bịawa ọmụgwọ, ọ na-azụtara nwa ya ụfọdụ ihe dịka mmanụ, ogiri, nnu, ose, ụtazị, ụzịza, okeọkpa n’uwe nwa. Di nwaanyị mụrụ nwa na-enwekwa aṅụrị pụrụ iche n’ihi na nwunye ya mụtara ya nwa.

N’ihi nke a, ọ na-amanyemi nnọọ aka n’akpa wee na-azụtara nwunye ya ihe oriri dị ka ji e ji a sụrụ ya nri, anụ n’azụ buru ibu. A na-esiri nwaanyị ahụ ofe pụrụ iche dịka nsala nke ọ na-eji nri ji ma-ọbụ agadi were e butu.

Ofe a na-adịkwa ọkụ, nke na-enye aka were ekpochapụ ime ahụ nwaanyị mụrụ nwa, ka ọ dị ka ọ dị na mbụ. Ose na-atụkwasị ofe ahụ nke ọma. Ụfọdụ oge, a na-azụtara ya nkwụ ọcha. Ihe ndị a na-enye aka ka mmiri ara ya gbaa ọfụma.

N’oge ọmụgwọ, nwaanyị mụrụ nwa enweghị ihe ọ na-arụ. Naanị, rie nri, nye nwa ara, saa ahụ, rahụ ụra maa letakwa ndị ọbịa. Nke a bụ ka ike ya laghachite nke ọma, maka ọrụ ịleta nwa ya anya nke ọma tinyere ọzụzụ ya n’ọdịnihu.

Ka izu asaa gachara, nwaanyị a pụta na ọmụgwọ. Ọ bụkwa ụbọchị ahụ ka a na-agụ nwa aha. A na-ezi ọhaneze ụbọchị ahụ, ma sikwa erimeri ụtọ dị iche iche. Emechasịa, nwaanyị mụrụ nwa ga-aga ahịa nwa ya n’ụbọchị nnukwu obodo ha.

Mgbe nne nwaanyị lere ọmụgwọ na-ala, ọgọ ya nwoke ga-azụtara ya ọtụtụ ihe onyinye dịka akwa, mmanụ, osikapa, wdg. Mana okwunụka na-adapụta n’etiti ọgọ nwoke na nwunye ya ma ọ bụrụ na mma nwoke adịghị. Dịka omenala ndị Igbo si dị, e kwesịrị ịnye nne nwaanyị lere ọmụgwọ ihe onyinye.

N’ihi ya, di na nwunye na-enwekwa nghọtahie n’ụdịrị onyinye a ga-enye, tụmadị ọ bụrụ na nwoke ejighị ego. Ụfọdụ onyinye e nyere nne nwaanyị mụrụ nwa bụ nke ọ na-eke ndị enyi ya ma ọ laruo, iji gwa ha na nwa ya nwaanyị mụrụ nwa.

Ọmụgwọ dị oke mkpa n’ala Igbo, maka ọ na-enyere ụmụ nwaanyị aka ị gbakee n’ahụ mgbu na mgbanwe nke ịmụ nwa ọhụụ na-eweta.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.