Ncheta Cyprian Ọdịatụ Ekwensi

60709723 336474620393336 6484308567914734400 n

N’ụbọchị taa n’afọ 2007 ka Cyprian Ekwensi zara oku ọnwụ. Ọ bụ n’ụlọọgwụ Niger Foundation dị n’Enugu Steeti ka ọ lara mmụọ site n’aka ọrịa. Na ndụ ya, ọ bụ nwa afọ Nkwelle Ezunaka dị n’okpuru ọchịchị Oyi nke Anambra Steeti.

A mụrụ ya n’afọ 1921 na Minna, Niger Steeti. Ọ gara akwụkwọ na Government College Ibadan, mechaa gụọ “Pharmacy” na “Lagos School of Pharmacy” nakwa na “Chelsea School of Pharmacy” nke dị na London.

Ọ kụziri na Igbobi college, ma rụọ na “Nigerian Broadcasting Corporation” ya na “Ministry of Information” nke ọ mechara bụrụ “Director” n’ebe ahụ. Ka agha Biafra dara, Cyprian chiliri aka elu n’ọkwa ahụ, ma kpọrọkwa ezinụlọ ya lọta Enugu. N’ihi naanị osisi nụrụ na-aga egbu ya kwụchie ụzọ.

Dịka onye ndị Igbo mara na ọ nwere isi ọma, e mere ya onyeisi mgbasa ozi na Biafra nke ọ rụgidere ruo mgbe agha biri. Mana ọ bụ na-ịdee akụkọ e roro ero, ka Ekwensi jiri bụrụ ọkaibe, maa bụrụkwa onye e ji ama atụ ruo ụbọchị taa.

Ọ deere ọtụtụ akwụkwọ ma ndị e bipụtara n’akwụkwọ, ndị a kọọrọ n’igwe redio, tinyekwara ndị e ji mee ihe nkiri television. Akwụkwọ ya kachaa daa ụda bụ People of the City(1954), Drummer Boy(1960) na Jagua Nana(1961).

Ọ nwetarakwara onyinye kwanyere ya ugwu n’afọ 1968 nke si n’aka Dag Hammerskjold maka “International Prize in Literature.” Cyprian Ekwensi lụkwara nwunye nke aha ya bụ Eunice. Chineke gọzikwara alụm di na nwunye ha wee nye ha ụmụ ise.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.