Ịgụ Nwa Aha

8ee768a387d1a971efc6e7a56d477eae 1000 images about dibujo baby child dedication clipart 3300 2967

Aha mmadụ bụ ihe e jiri mara ya. Ọtụtụ mmadụ na-aba anụmanụ ha nwere aha, tụmadị ndị nwere nkịta. Ebe a bara nkịta aha, ọ bụzị mmadụ ka agaghị aba ezigbo aha?

Ọ bụ ihe mwute n’ụfọdụ ndị Igbo n’ụbọchị taa na-enye ụmụ ha aha ndị Bekee, tụmadị ndị ha amaghị ihe ọ pụtara. N’omenala Igbo, a na-agụ nwa aha n’ụbọchị nke asatọ site n’ụbọchị a mụrụ ya. N’ụbọchị ahụ ndị ikwu na ibe tinyere ndị enyi ga-abịa. A ga-esi ihe oriri, butekwa mmanya.

vllkyt66e73eg57jl
Toddy Bottle and Glass

Tupu a malite oriri, a ga-ekuputa nwa rịọ okenye nọ n’ezinaụlọ ahụ ka ọ gụọ nwa ahụ aha.

blog 1483004287namingceremony

Ọ gụzịa ya, nne na nna ga-agụkwa nke ha. Ndị Igbo na-asị na aha onye na-achị ya.

f822f977bc442a4655d54b6770746533 1

Nke a pụtara na mmadụ na-eme omume ma ọ bụ na ihe na-eme na ndụ ya dị ka aha a gụrụ ya si dị.

f822f977bc442a4655d54b6770746533

Ya mere o ji dị mkpa na-agụrụ nwatakịrị aha ziri ezi nke ga na-ewetakwara ya ngọzi na ihe ọma. Aha ọ bụla e nyere nwa n’ala Igbo nwere ihe ọ na-ezipụta. Onye a gụrụ Okeke/Nweke bụ onye a mụrụ n’ahịa eke.

Ndị Igbo na-enyekwa aha site na nkwenye ha kwenyere na Chineke, nke mere ha ji enye aha ndị a: Chidaalụ, Chiọma, Chukwuemeka, Chidị, wdgz. Onye nwa hịara ahụ mechaa mụọ nwa na-agụkwa aha dịka Obiajụlụ, Kasiemobi, Chielotam, wdgz. Nke a bụ iji kelee Chineke maka nwa o nyere ya.

Ụfọdụ na-agụkwa aha ndị a Adaọra, Ifeọra, Nwaọra maka kwenye ndị Igbo na nwa bụ nke ọha. Ndị ọzọ na-agụ aha dịka Mmadụka, Nwamaka na Nwakaego maka na nwa kachaa n’ihe niile dị n’elu ụwa dum.

Na ị chịkọta, aha ọ bụla ezi nwa afọ Igbo nyere nwa ya na-adị omimi, ma nwekwa ihe ọ na-egosipụta. Ọ bụ kwenye ndị Igbo na aha a gụrụ mmadụ na-eso ya. Nke a gosiri na mmadụ na-ebi ndụ dịka aha a gụrụ ya si dị.

Ọ bụ n’ihi nke a, ka a na-eche echiche nke ọma tutu a gụọ nwa aha, ka e wezuga iji aha gụgbuo onye ahụ.

Ndeewonụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.