
Onye maara ihe gbasara mkpụrụokwu Igbo ga-ekweta na “A” bụ mkpụrụedemede mbụ. Tupu ị ga n’ihu ịgụpụta mkpụrụedemede Igbo ịghaghị ibu ụzọ kpọpụta “A.” Otu a ka ọ dị onye bụ Ada n’ala Igbo. Tupu ị gụọ ụmụnwaanyị a mụrụ n’ezinaụlọ, ị ga-ebu ụzọ chọpụta onye bụ ada nke ụlọ ahụ. Ọ bụrụ na ị chọpụtaghi onye bụ ada, ihe niile ị na-agụ enweghị isi.
N’ala Igbo, onye bụ ada bụ nwanwaanyị mbụ bịara ụwa n’ezinaụlọ ahụ. Ada abụghị onyinye amara. Onye bụ Ada si n’afọ nne ya bụrụ ada. Ọ bụrụkwa ụmụ ejima, nwaanyị nke mbụ pụtara n’afọ nne ya abụrụla ada. N’ihe niile ọ bụ naanị ụmụnwaanyị ka a na-akpọ ada. O nweghị nwoke ọ bụla bụ ada. Ada bụ ihe ụmụnwaanyị, ọ gbasaghị ụmụnwoke.
Ndi bụ ada nakwa enwe aha e jiri mara ha. Nne na nna mụrụ ada na-enye nwa ahụ aha nke ya kpọmkwem. N’obodo Ụmụagụ, e nwere nwaanyị bụ ada, nne na nna ya nyere aha bụ Ọlaọcha. Aha ya bụ Ọlaọcha, ebe ọnọdụ ya n’ezinaụlọ bụ Ada. N’obodo Ụmụdịawa, e nwekwara nwaanyị bụ ada ma nne na nna ya nyere ya aha bụ Ijeọma. Ijeọma bụ aha ya, ebe ọnọdụ ya bụ ada n’ezinaụlọ. N’obodo Ụmụire nke Ihenweorie, ama m nwaanyị bụ Ada ma nne na nna ya nyere ya aha bụ Obịageriakụ.
Ada nwere ike ịdị ụzọ abụọ n’ụfọdụ ezinaụlọ. Gịnị ka nke a pụtara? Ihe ọ pụtara bụ n’ezinaụlọ nna lụrụ nwaanyị abụọ maọbụ karịa, e nwere ike ịnwe ada nna nwee ada nne. Ada nna bụ nwanwaanyị mbụ nwoke mụrụ. Ọ bụrụ nwoke nwere nwunye iri maọbụ asaa, nwaanyi mbụ a mụrụ n’ezinaụlọ ahụ bụ ada nna, ma nne ya ọ bụ nwunye nke ikpeazụ, ma ọ bụghị. Nne ya nwere ike ịbụ nwunye a lụrụ afọ gara aga, obere nwaanyị ahụ ọ mụrụ abụrụla ada. Ọ bu ya tọrọ ụmụnwaanyị ndị ọzọ a ga-amụ n’ụlọ ahụ. Ndị nwunye nke ọzọ nwere ike bido mụwa naanị ụmụnwaanyị. Ha nwere ike na-amụ ejima ụmụnwaanyị, ha dum agaghị abụ ada. Mgbe a mụrụ ada ka ọnụ ụzọ ịmụ ada ọzọ mechiri.
Ọnọdụ ada abụghị ihe a na-azọ azọ. Ọ bụghị ihe a na-ekpere ikpe. Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị. Onye bụ Ada, bụ Ada. N’ala Ụmụahịa, ngwa ngwa a mụchara nwaanyị mbụ bụ ada, ụmụnwaanyị niile bụ ụlụ ka anyị na-akpọ ha. Mgbe ada kwuchara okwu ka ụmụnne ya nwaanyị ndị ọzọ ga-ekwu okwu. Dịka otu ọkpara na nna ya si dị na mma bụ ka ada na nne ya si dị na mma. Ada bụ nwanne ya; ada bụ enyi nne ya. Nne na ada na-agba izu, izu ha gbara, ntị ọzọ anaghị anụ ya. Ọ bụghi na nne na ụmụ ya nwaanyị ndị ọzọ agaghị emekọrịta, mana ihe jikọrọ ada na nne ya kariri ihe jikọrọ ya na ụmụ ya nwaanyị ndị ọzọ ma e soro ọdịnala igbo.
Ada na nne ya dị ka imi na anya. Maka ndị Igbo na-ekwu na ihe metụrụ anya, metụrụ imi. Imi bewe, anya ebewe, maka na imi na anya bụ ụmụnne. Ihe nne enweghị ike ịgwa onye ọzọ, ka ọ na-agwa ada ya. N’aka nke ọzọ, ada anaghị eme ihe ma nne ya amaghị. N’oge ọrịa, Ada na-anọ nne ya nso karịa ụmụnne ya nwaanyị ndị ọzọ. A bịa n’ezinaụlọ, ọ bụ ese ada ka a na-ebu ụzọ ajụ.
Onye bụ Ada?
Kedụ ihe o kwuru?
Unu agwakwala ada unu tupu unu ebido ime ihe a?
Cherenụ ka ada bịa.
Ọ bụrụ na anyi ahụghị ada, anyị agaghị ekwu okwu.
Ọ bụrụ oge nne nwụrụ, ọ bụ ada na-anọ n’akụkụ ozu nne ya. Ọ bu ya ga-ebu ụzọ kwuo okwu tupu e tinye ozu nne ya n’ili. Ada na-ahazi olili nne ya. Dịka ọkpara na-eketa nnukwu ihe n’aka nna ya ka ada si eketa ihe buru ibu n’aka nne ya. N’ụfọdụ obodo, ọ bụ ada nwe akwa niile na ihe niile nne ya ji esi nri. Ọ ga-eburu ha laa n’ụlọ di ya ụbọchị achọrọ nne ya ma a hụghị ya. N’obodo ọzọ, ọ bụ ada ga-ekere ụmụnne ya ndị nwaanyị akwa na ihe ndị ọzọ nne ha hapụrụ n’ụwa. Ada ga-ebu ụzọ họrọ ndị ọ chọrọ tupu ọ keere ụmụnne ya ihe ndị fọdụrụ.
Ụwa ada abụghị ụwa ọma otu unu chere. Ụwa ada jupụtara n’ụwa ọma na ọrụ dịịrị ya. N’ezinaụlọ nwoke kọrọ n’ụfọdụ obodo, ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-alụ di, ma ada agaghi alụ di. Ada ga-ebiri n’ụlọ nna ya na-amụ ụmụ n’aha nna ya nwụrụ anwụ. Ada ketara akwa nne ya, na ihe ndị ọzọ nne ya nwere mgbe ọ nwụrụ, ma ọ lụghị di n’ihi na ọ nọ n’ụlọ nna ya amụrụ nna ya nwụrụ anwụ ụmụ ka aha ha hapụ ifu.
Otu ihe si dịịrị nwoke bụ ka ihe siri dịịrị ada. Ada anaghi aṅụ mmiri tọgbọ iko. Ọrụ ada nke ịmụ nwa n’ụlọ mebiri uru ọbụla e chere ada na-eri. Kedụ ihe ị ga-enye nwaanyị kariri ikwe ka ọ lụọ dị? Ị maghị na di bụ ugwu nwaanyị. Nwaanyị alụghị di nọ ọnọdụ ka onye gba aka n’ụwa ya.
Ụmụnwaanyị ndị a bụ ada sokwa n’otu ụmụada. Onye bụ ada n’ụlo nna ya chọrọ isonye n’otu ụmụada nwere oghere. N’ụfọdụ obodo ụmụada abụghị naanị ụmụnwaanyị nọ na di. Ụmụnwaanyị anọghị na di sokwa. Onye bụ ada n’ụlọ nna ya na-enwe nsọpụrụ n’otu ụmụada.
Na mmechi ihe odide a, achọrọ m ka ndị bụ ada gaa n’ihu ime ka ụlọ nna ha dị mma. Ha adala mba n’ọrụ. Ha ekwela ka ihe ọbụla wepụ anya ha n’ọrụ ndị ada. Ndị ezinaụlọ ahaghị ịsọpụrụ ada. Chetanụ na ijiji enweghị onye ndụmọdụ na-eso ozu ala na ili. Atụrụ enweghị onye nche na-abanye n’ọnụ ọdụm. Onye na-asọpụrụ ada na-asọpụrụ ọdịnala Igbo. Onye jụrụ ịkwanyere ada ugwu na-emerụ ala. Onye merụrụ ala, ala na-emerụ ya.
Daalu nụ
Odee: Iwuọha Prince
+2348138460701
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

