
N’ụbọchị taa n’afọ 2014 ka Justice Oputa zara oku ọnwụ.
Na ndụ ya, Oputa bụ nwaafọ Oguta nke dị n’Imo Steeti. Ọ bụ naanị ya ka nne na nna ya mụrụ. Ọ gara akwụkwọ sekọndịrị na Christ The King College (CKC), Ọnịcha. Ebe a ka o lere ule ‘WASC’ n’afọ 1940. O si ebe ahụ gaa Yaba Higher College tupu ọ gawa Achimọta college dị na mba Gana, ozigbo agha mba ụwa nke abụọ dara.
N’ebe ahụ ka ọ gụrụ Ịkọnọmiks nke o nwetara nzere ya n’afọ 1945. O si ebe ahụ tinyekwa isi na London, gụọ ma nweta nzere na ‘History’ tinyere nzere na ‘Law’ n’afọ 1953. Ọ lụrụ nwunye ya bụ Margaret Ntịanụ Oputa, ma mụọ ụmụ ise, nke otu n’ime ha bụ Charles ‘Charly Boy’ Oputa. Odogwu a bụ otiegwu a ma ama n’ala anyị.

O gosikwara na ọ maara ihe ekwe na-akụ na “Law” mgbe o doziri nghọtahie e nwere n’okwu “Oguta Chieftancy title” n’afọ 1959.

Ọzọ dị ka ibe ya, o tinyekwara ọnụ n’okwu echichi ndị Ameyanabo nke ndị Rivas Steeti n’afọ 1960. N’afọ 1976 ka e buliri ya n’ọkwa, mezịa ya ọkaikpe kachasị nke Imo Steeti. O ruo n’afọ 1984, e mee ya Ọkaikpe ndị Ụlọikpe kachasị na Naịjiria, bụ ebe ọ rụrụ ọrụ afọ ise tupu ọ laa ezumike nka n’afọ 1989.

Ike ọ kpara dịka ọkaikpe n’ala Naịjirịa mere e ji kpọwa ya “Socrates.” O dere ma bipụta ọtụtụ akwụkwọ mgbe ọ nọ ezumike nka, tutu onyeisiala bụ Olusegun Obasanjo akpọkue ya ka ọ bịa nọrọ n’isioche nke a gụrụ “Oputa Panel” gbasara inyocha ọchịchị ndị soja megide ndị nkịtị malite n’afọ 1984 ruo afọ 1999 n’ala Naịjirịa.

O jighịkwa ife Chukwu ofufe egwuri egwu, nke mere onye ndu ndị ụka Katọlik bụ Poopu ji chie ya echichi Knight. Ekele dịrị Chineke, maka ogologo ndụ ya nke mịpụtakwara ọtụtụ mkpụrụ. Ọ gbara afọ iri iteghete na asatọ mgbe ọ nwụrụ.
Ka mkpụrụ obi ya gaa n’ihu na-ezu ike n’udo.
Ami.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

