Chief Chidị Anyaegbu(Chisco)

IMG 20200825 WA0003

A mụrụ Chidị Anyaegbu n’ụbọchị taa, n’afọ 1956. Ọ gara akwụkwọ na St. Andrews nke dị n’obodo ya bụ Amichi, Anambra Steeti. Ka obere oge gachara ọ gụchara akwụkwọ, o so nna ya ukwu gawa Legọs maka ịmụ ahịa ihe ọgbatumtum.

Ọ malitere nke a bido n’afọ 1974 ruo afọ 1977. N’otu afọ 1977 a ka ọ malitere ahịa nke aka ya site n’otu narị naịra na iri abụọ na 28 Denton Street, Ebute Metta, Legọs. Maka e mere elu, e mere ala, onye ọ bụla ga-aza aha ya.

Otu ụbọchị o so enyi ya gaa “Wharf” nke dị na Apapa ị gbapụta ahịa. N’ebe a ka ọ nọ zute otu nwoke nyere ya ahịa ka ọ ree. Ụmụ ibe, ọ kwa otu a ka ndụ Chisco si gbanwee. Ọ bụ uru pụtara n’ahịa ahụ ka o ji wee banye maa bụrụ onye ahịa ndị “Leventis Motor Spare Parts” ejighị egwuri egwu.

ceo

O si ebe a wee mepe ụlọọrụ nke na-ebugharị ụmụ mmadụ tinyere ibu ha. Ọzọkwa, ọ malitere akwụkwọ mgbede nke ndị Legọs Steeti hibere n’oge ahụ. Mana nke a emeghị ka uche ya pụọ n’ahịa ya ma ọlị.

Mana oge ọ malitere gụwa maka ịbụ ọkaikpe, ka o ji ire ya gụọ eze ya ọnụ, maka mmadụ anaghị a mụ akaekpe na nka. Ọ chezịrị ihu n’ahịa ya. Ọ mechara gaa akwụkwọ n’ihe gbasara “Entrepreneurship” na mba France, America, Germany na United Kingdom.

speaker chidi anyeagbu

A makwa Chisco dịka onye na-agbasapụ aka, maka ọ rụrụ ụzọ, ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ n’obodo ya. Maka akụ ruo ụlọ bụ okwu maa bụrụkwa ụzọ ndị Igbo.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.