
Tupu emume ọfala, ndị Ụmụikem n’Ọnịcha na-enye ụkwụ na nlọ. Ụbọchị ha ga-amalite nke a, ha na-eti egwu a na-akpọ Awa Mmee. Oge a ka e ji agba afa, ị mata ma ihe ọma, ma ihe ọjọọ ga-eme n’afọ, tinyere aja a ga-achụ wee wezụga ihe ọjọọ.
Ha malite nke a, ha eje gwa Obi ihe afa kwuru, ma nyekwa ya ụkwụ na nlọ, nke ọ ga-anọ abalị anọ. Ya bụ ndị Ụmụikem nyee ụkwụ na nlọ, onye ọ bụla akwadowe, mara na Ọfala akụwala aka n’ụzọ. Ogbe ọ bụla ga-anọ na be ha na-akwado, maka ha ga-etiri egwu wee dute ndị Ichie ha ụbọchị Ọfala. Obi ga-anọkwa na-akwado.
Ụmụnne ya na ụmụnna ya ga-edute ndị dibịa na-ahụ ụzọ nke ọma, ka ha bịa nyoo ime ụlọ ya na obi ya, ka o doo anya na o nweghị ihe mmadụ ga-eji merụọ eze ahụ. Chi fote ụbọchị Ọfala, Obi agbaa ọnụ egbendu atọ, ka ndị mmadụ mara na oke ụbọchị e ruola. Ihe dị ka elekere abụọ nke ehihie, Obi agbakwaa ọnụ egbendu atọ ọzọ. Onye ọ bụla amalite kwadowe na-agbada n’ime obi eze.

Mmụọnwụ anaghị a bịa ụbọchị Ọfala, maka mmụọ anaghị a baa n’ime obi. Ọ baa, ị mara na Obi na ndị obodo nwere nnukwu okwu na ụka. Obi kwadochaa ị pụta, a gbaa ọnụ egbendu atọ ka ndị mmadụ mara na o ruola mgbe ọ ga-apụta. Ọ na-apụta, ndị ochie a na-eso ya n’azụ, na-agụkwa Obi Echie! Ewoo Ewoo!

Egwu a na-agụ, Obi ejegharịa letazuo ndị niile ọ na-achị. Ọ letachaa ha, o je tee egwu ozi, wee baa n’ime obi ya. Obi baa n’ime ụlọ, o kpupu okpu eze ya, kpuru okpu ododo ya. Ọ nọrọzịa, ndị Ichie a bịa na-akwanyere ya ugwu, na-ekwe ya nkwa na ha kwụ ya n’azụ, ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ.

Ha gbarakwa egwu ozi nke ha na-abịa, ha e were ohere ahụ na-echetara ya ọrụ dịịrị ya n’ebe ndị Ọnịcha nọ. Ka ha na-esi agba egwu a na-echetara ya ogologo ije, na ahụhụ ndị Ọnịcha tara tupu ha ruo ebe ha bi taa.
Onye Ichie mbụ na-ebu ụzọ agba egwu a bụ Onowu. Ọ gbachaa Ajie, Odu, Ọnyaa, Ogene, na Owele agbaa nke ha. Ha mechaa nke a, Obi akwadowe maka ịpụta nke abụọ. Ọ pụtachaa, ndị si obodo ọzọ bịa maka Ọfala a bịa kwanyere ya ugwu. A kụọ mgbịrịgba, Onowu a pụta bịa kaara ndị Ọnịcha ihe afa kwuru. Ihe ọma na ihe ọjọọ ga-eme n’ime afọ, na aja a ga-achụ iji gbochie ndị ọjọọ.
Obi pụta nke atọ, tee egwu, ọ laghachi azụ. Ọ bamie nke atọ a, a mara na ihe ọ fọrọ ụbọchị ahụ bụ sọ riwe oriri, nwenwe aṅụrị, gbawa egwu.
Azụ Ọfala
Ụbọchị so Ọfala ka a na-akpọ azụ Ọfala. Ọ bụ ụbọchị ụmụaka na ụmụ okorobịa, mana o gosighị na ndị Ichie anaghị a bịa. Ihe a na-eji eme azụ Ọfala bụ inye ụmụaka ohere ka ha hụ Obi anya nke ọma, mara onye ọ bụ, maka na ha anaghị enwe ike abịaru ya nso nke ọma ụbọchị Ọfala n’ihi igwe mmadụ na-abịa.
Ụbọchị a ka ọgbọ dị iche iche na-enwe ohere na-abịa a kwanyere Obi ugwu. Ọ na-enyekwara Obi aka ịhụchata ndị ọ na-achị, mara ma ha na-abawanye ụba ka ha na-epenata mpe, ma ha na-abawanye ọgaranya, ka ha na-adawanye ogbenye. E mechaa Azụ Ọfala, ndị Ọnịcha a mara na Ọfala a gwụla.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

