Otu ugboro n’ime afọ, ndị Ọnịcha niile na-ala obodo ha maka otu nnukwu oriri ha na-eri otu ugboro n’ime afọ ọ bụla. Ị jụọ ha ihe oriri a bụ, ha a sị gị na Obi Ọnịcha na-agba ọfala. Onye na-abụghị onye Ọnịcha nwere ike jụọ sị, ‘Gịnị bụ ọfala?’

Akụkọ a kọrọ sị na mgbe ndị Ọnịcha si n’ebe ha bibu mbụ bụ Iduu were tara ahụhụ bịa ebe ha bi ugbu a. Ha gabigara ọtụtụ ihe nhịa ahụ, nke otu n’ime ha bụ agụụ. Ụfọdụ ihe oriri nke ha riri gburu ha. Ya mere mgbe ha hụrụ ji, ma gwupụta ya n’ime ala, obi esighị ha ike i tinye ya n’ọnụ. N’agbanyeghị ọcha ọ na-enwu ka mbara igwe.
Ya mere otu dibịa a na-akpọ Awụma na-ahụ n’ime mmụọ ji buru ụzọ rie ji. Ka abalị atọ gara, ọ bụrụ na ọ nwụghị. E mechaa, ndị echichi ụfọdụ e soro rie ya bụ ji, o nwekwaghị ihe mere ha.
Nke a mere ndị okorobịa ji sị na ha ga-eri ji. Ya bụ ihe gbara Obi ka akpị. Maka ọ bụ ha bụ ndị na-akọ ugbo, na-alụkwa agha. Ọnwụ gbuo ha, gịnị ka eze Ọnịcha ga-akọrọ Chi ya?
Eze nọ na-eru ụjụ, hapụ obi ya bịa nọrọ n’ọnụ ụzọ ama ya nke a na-akpọ ụnọ ibube. Ka chi foro, ndị Ọnịcha gbara egwu a na-akpọ Ọgbalido, na-aṅụrị na ji egbughị ụmụ okorobịa be ha.
Obi aṅụrị Obi kachakwa nke mmadụ dum. Ọ bụ aṅụrị Obi a ka a gụrụ Ọfala. Dị ka ọmenala Ọnịcha si dị, ọ bụ ụbọchị ọfala ka eze ji asị ndị agha ya nnọọ, maka ị lọghachite n’udo. Ọfala na-enye ndị Ọnịcha ohere ịnọ Obi nso, hụ ya anya, mara onye Obi bụ, maka n’oge gboo, Obi Ọnịcha anaghị a pụta aghara aghara. Ọ nọ ọnọdụ ka oke mmọnwụ na-apụta n’afọ.
Ọ bụkwa oge eze ji na-enwe ohere na-eleru ndị ọ na-achị anya nke ọma, mara ma ha na-amụbanye, amụbanye, ka ha na-anwụfucha anwụfucha. N’oge ọfala ka a na-eji a gbara ndị Ọnịcha afa maka ihe ga-eme n’ime afọ ahụ.
Ya mere ha ji were Ọfala ka oke ihe na-asịkwa ‘Ọnịcha anaghị anọ hapụ inwe eze, eze anaghị anọ ghara ịgba ọfala. Mmadụ anaghị a gbachitere eze Ọfala. Ọ nwụọ, a ga-agbara ya Ọfala ikpeazụ, nke ndị Ọnịcha ga-eji mara na eze ha anọkwaghị ndụ.
A na-akwado Ọfala, asụsụ ndị Ọnịcha na-asụ maka kwado a bụ “na ha na-awụ arụ” nke pụtara, na ha na-eme onwe ha n’ụdị ha ga na-egbuke egbuke ka ugegbe ụbọchị Ọfala.

N’oge gboo, Eze Ọnịcha na ndị Ichie ya ga na-erekwa ọgwụ ha ka ndị mmadụ ghara ịkọtu ha, menye ha ihere n’ihu. Maka e menye Obi ihe ihere, a mara na e m enyela Ọnịcha dum ihe ihere.
Nke a si n’akwụkwọ Tony Ubesie– Ọdịnala Ndị Igbo. Izu ọzọ, anyị eleba anya na Nkwado na Emume Ọfala.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

