
N’ala Igbo niile, egwu ọnwa bụ ihe na-enye ụmụntakịrị na ndị ntorobịa ọṅụ pụrụ iche. Mgbe ọ bụla ọnwa ọhụrụ pụtara, obi na-atọ ụmụntakịrị ka mmanụ aṅụ. Ha na-eti mkpu dị iche iche iji sị ọnwa ọhụrụ nnọọ. Ụfọdụ na-asị:
Ọnwa chekwaa m ka nnekwu ọkụkọ chekwara nwa ya.
Chekwaa m ka ọkụkọ ụgụrụ.
Onye sị gị gbuo, jụọ ya o gbukwara.
Onye sị gị bọọ, jụọ ya ọ bọkwara.
Mgbe egwu ọnwa na-ekpokarị ọkụ bụ n’oge ọkọchị. Ebe niile na-adị kọrọkọrọ. Ụmụntakịrị niile na-agba mbọ jesie ozi niile dịịrị ha n’ezinaụlọ. Ndị na-esi nri ga-esicharị nri n’oge, zachasịa ebe niile. Ndị na-ekute mmiri ga-ekujusị mkpọmkpọ na ihe mmiri niile dị be ha. Ahụ na-eme ha gara gara n’ije ozi. Ha achọghị ihe ga-egbochi ha ije egwu ọnwa. Ụfọdụ agaghị echere rie nri abalị, maka ihe ọkụkọ bu mmiri achụ dị ya oke mkpa.
Mgbe ọnwa na-awalite, ụmụntakịrị amalite kpọwa oku, tiwe mkpu egwu ọnwa. N’otu ntabi anya, ama egwuregwu ejula, ebe niile amalite kpọtụwa akpọtụ, zụwa azụ. Ndị nwoke na-ehi egwu maọbụ mgba nke ha. Ụmụ nwaanyị na-anọkwa nke ha na-agụ nwa egwu ha dị ka nke a:
Onye jere be enyi ya oo?
Merere mme!
Chiọma jere be enyi ya oo
Merere mme!
Rie nwa ji n’ibe n’ibe,
Rie nwa ede n’ibe n’ibe,
Akwa ọkụkọ ọrọrọ,
Akpara igu nzanza,
Osisi kwụrụ n’ọhịa
Nwata ji amụ elu,
Ọ rịdata ọ rigoro,
Kpọ ya merere mme,
Merere mme ee,
Merere mme.
Mgbe ụmụ nwaanyị chọrọ ka ụmụ nwoke ha bịakwute ha, ha ewere aha otu onye n’ime ụmụ nwoke gụọ egwu. Mgbe ahụ, a tụpụrụla nkịta ihe n’ezi; ọgụ bụzị nke ya na ụmụ mmụọ. A na-achụsasị ụmụ nwaanyị n’ọgbọ egwu ha. E mesịa ha niile ehie otu ọgbọ egwu malite egwuregwu ndị ọzọ. Ndị nne na nna ụfọdụ na-apụta nọrọ n’otu akụkụ na-akọ ihe mere mgbe ha dị na ntorobịa.
Ha nọọ obere oge, ha alasasịa. Mgbe ụfọdụ, a na-anọ egwu ọnwa ruo ndeeri. Mgbe ike gwụrụ ha n’egwu, ụfọdụ anọsasịa na-akọ nwa akụkọ. Egwu ọnwa bara uru. Ọ na-eme ka obodo kpoo ọkụ. Ndị ohi enweghị ike ịpụta zuo ohi. Egwu ọnwa na-emekwa ka ahụ sie ụmụntakịrị ike. Ha na-enwe ọṅụ ma nwebiga ya oke. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ n’egwu ọnwa ka ndị ntorobịa na-amata onwe ha.
Ndị hụrụ onwe ha n’anya nwere ike tolite lụọ di na nwunye. Ọ na-eme ka ụmụntakịrị jee ozi n’ụlọ nke ọma. N’aka nke ọzọ, ọ bụkwa n’egwu ọnwa ka ndị ntorobịa na-amụta agwa ụfọdụ jọrọ njọ. Ha adịghị arahụ ụra n’oge. Mgbe ụfọdụ ha agaghị eme ihe omume ndị nkụzi sị ha mee n’ụlọ. Ha bịa n’ụlọ akwụkwọ, ụra eburu ha. Ihe na-atọ ụtọ na-egbukwa egbu. Egwu ọnwa adịghị ekpozi ekpo dị ka mgbe gboo. Ọ bụ egwu pụtara n’ihu azị ka ha na-agba.
Nke a si n’akwụkwọ Ọmụmụ Asụsụ Igbo nke mbụ.
Ndị deere ya bụ L.O Igwe, D.O Ibe na R.A Ezeụmụdo
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

