N’ụbọchị taa n’afọ 2011 ka nnukwu onye ọzụzụ atụrụ Chineke a zara oku ọnwụ. Na ndụ ya, ọ bụ onye Nanka nke dị n’Anambra Steeti.
Ndị maara ya nke ọma kwukwara na o nwere mmasị pụrụ iche n’akwụkwọ ya, nke mere o jiri gaa ụlọakwụkwọ dị iche iche dịka DMGS, Ọnịcha. Nke a kwadoro ya n’ụdị pụrụ iche n’ọrụ ya ijere Chineke ozi.
Dịka ‘Bishop Niger Diocese’ ọ wetara ọtụtụ mgbanwe baara ụmụ mmadụ uru dịka ị guzo ụlọakwụkwọ ndị a:
- Bishop Crowther Seminary, Ọka.
- Holy Innocent Juniorate Convent, Nkpọr.
- St Monica, Ogbunike.
- St Christopher Seminary, Ọnịcha-Nsugbe.
- Bishop Onyemelukwe Sekọndịrị, Ọdọakpụ-Ọnịcha. Wdg.
O guzobekwara ụlọọgwụ dịka:
- Niger Diocesan Hospital, Ụmụnze.
- Niger Diocesan Hospital, Nnewi.
- Niger Diocesan Hospital, Agụleri, Ụmụleri, wdg.
Ọzọkwa, dịka onye ghọtara mkpa ahụike ụmụmmadụ bara, ọ kabara ahụ kwado ndozi ụlọọgwụ Iyi-Enu nke agha Biafra kpọdoro isi n’ala.
Ihe ndị ọzọ ọ rụrụ dị ọtụtụ, dịka ịhụ na a rụchara agadaga ụlọụka “All Saints Cathedral” dị n’Ọnicha. Ọzọ dịkwa mma ị rụtụ aka bụ ịwebata ochichi “Knighthood of St. Christopher.” Nke a soro mee ka ndị nnukwu mmadụ nwezịa mmasị pụrụ iche i jee ụka.
N’ezie, ndụ Onyemelụkwe abụghị n’efu ma ọlị. Ọ bụ ndụ, e biri na-ijere Chineke ozi, maa mịtakwara mkpụrụ na ndụ ụmụmmadụ, ma nyere ha aka ịbara onwe ha uru, jirikwa ndụ ha mepụta ihe.
Maka ịmatakwu akụkọ banyere Onyemelụkwe, gaa zụrụ akwụkwọ “Archbishop Jonathan Arinzechukwu Onyemelukwe: A Colossus of Our Time” nke onye dere ya bụ Enuma. W. Okoli. Ị ga-enweta ya na bukshọọpụ “All Saints Cathedral, Ọnịcha.”
Daalụ nụ.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.


