
Maazị Pita Obi bụ nwaafọ Igbo a ma ama na Naịjirịa. Ọ bụ onye Agụlụ nke dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha n’Anambra Steeti. A mụrụ ya n’afọ 1961. Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Christ The King College dị n’Ọnịcha.

Ọ mechara gaa mahadum Naịjirịa dị na Nsụka, ebe ọ gụrụ “Philosophy”. Pita gakwara ụlọakwụkwọ dị icheiche na mba ofesi dịka “Harvard Business School” na “London School of Economics” ebe ọ nwetakwara nzere kwesịrị.
Dịka nwaokorobịa, Pita Obi malitere ahịa, ebe ọ gbadoro anya wee bụrụ ọgaranya. O sonyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị APGA ịbụ gọvanọ nke Anambra Steeti n’afọ 2003. Na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ọ zọrọ ka ọ jụrụ ajụjụ wụrụ onye onye ọbụla akpataoyi: “a bụrụ anyị ọnụ, ka ihe na-eme anyị o si anyị n’aka?”

Ka rịzọtụ pụtara, ndị INEC kwuru na ọ bụ Chris Ngige meriri.

Nke a ewezụghaghị Pita Obi ịga ụlọikpe, ebe e mechara kpebie na ọ bụ ya meriri n’afọ 2006. Ka ọ bụrụ gọvanọ, o mere ka ndị mmadụ ghọta na ego gọvmentị abụghị ka e were ya na-eme ka o siri masị onye. O doziri ụzọ, gbapuo mmiri n’ọtụtụ ụlọakwụkwọ, ma nyekwa ndịisi ụlọakwụkwọ ego ha ga-eji rụọ ọrụ kwesịrị n’ụlọakwụkwọ ha.

N’ala Naịjirịa taa, o nweghị ka a kpọba aha ndị nwere ike idozi obodo anyị dịka onyeisiala, ka a ghara ịkpọ aha Maazị Pita Obi.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

