Ji N’Ala Igbo

"Ka a nọrọ ntakịrị, ọ hụ ome puru n’ebe o liri ada ya na ebe o liri ọkpara ya. O wee ruo mgbe owuwe ihe ubi, o jee bọghee ebe o liri ọkpara ya hụ ji, je bọghee ebe o liri ada ya hụ ede. Ya mere ọtụtụ obodo ji kwenye na ji bụbu mmadụ."

Oge ụfọdụ ọ na-agba ndị mmadụ gharịị ihe mere ndị Igbo ji na-eme emume pụrụ iche n’afọ iji kelee maọbụ nabata ji ọhụrụ. Ọ bụ site n’ọtụtụ okwukwe ndị Igbo nwere n’ebe ji dị. Ndị Igbo na-akọ akụkọ na mgbe Chukwu kere ụwa na mbụ, na Chukwu nyezuru mmadụ ihe dum na-adị ya mkpa. N’oge ahụ, elu igwe na ala dị nso, nke bụ na mmadụ na-emetụ elu igwe aka. Agụụ gụọ mmadụ, o were mma bebiri urukpuru sie, rijuo afọ.

A sịrị na ọ bụ mgbe mmadụ mewere anyaukwu ka Ọbasị bi n’elu ji mee ka urukpuru rịa elu nke ukwuu, nke bụ na aka mmadụ anakwaghị eru ya. Agụụ chọrọ iwere ụmụ mmadụ n’elu ụwa nke bụ na e jere n’afa jụta ase ihe a ga-eme wee hụwakwa nri. Ọbasị wee sị mmadụ ya gbuo ada ya lie n’ala, ka o gbukwuo ọkpara ya lie n’ala. Mmadụ wee ruwe isi mee ihe Ọbasi gwara ya.

Ka a nọrọ ntakịrị, ọ hụ ome puru n’ebe o liri ada ya na ebe o liri ọkpara ya. O wee ruo mgbe owuwe ihe ubi, o jee bọghee ebe o liri ọkpara ya hụ ji, je bọghee ebe o liri ada ya hụ ede. Ya mere ọtụtụ obodo ji kwenye na ji bụbu mmadụ. Ọ bụ eziokwu na onye ọ bụla na-eche echiche agaghị ekwenye n’akụkọ a, mana o nyere aka gosi ka ndị Igbo si malite n’oge gboo ịkwanyere ji ugwu ka mmadụ, nke bụ na n’akụkụ Ovim, mmadụ anaghị agbakwasị ji ụkwụ ma ọ bụrụ na o meghị emume a na-akpọ Iwaju Aka.

Ebe ọ bụ na nri mbụ ndị Igbo nwere bụ ji na ede, e nyere ji ọnọdụ nwoke nọ n’ala Igbo, nyekwa ede ọnọdụ nwaanyị nọ n’ala Igbo. Ọ bụ n’ihi nke a ka ọ na-abụ a chọọ ime emume ọ bụla gbasara ụmụ nwoke, ihe e ji na-emekarị ya bụ ji. Nwoke na-eje ụlọ akwa, ihe ọ na-ebu na-eje bụ ji na mmanya. A bịa n’ichi ọzọ, ji bụ isi. A chọọ ịmata ka akụnụba nwoke nwere ha, ihe e ji na-amata bụ ka ọba ji ya ha, ya na ewu na atụrụ onye ahụ nwere.

N’ihi nke a, ebe ọ bụ na ndị Igbo bụkarị ndị ọrụ ugbo, otu ugboro n’ime afọ, obodo ọ bụla na-eme emume pụrụ iche iji kelee mmụọ nwe ji ekele, maka aka ọ na-enyere ha n’ọrụ ugbo.

Mmadụ nụ ka ndị Achị, Inyi maọbụ ndị ọzọ na-asị na ha na-eri otite, maọbụ ebe ndị Ọka na Enugwu-Ukwu na-asị na ha na-ala ụlọ ịga rie oriri ọnwa asatọ, maọbụ ebe ndị Bende na Etiti na-asị na ha na-eri oriri Ahịanjọkụ, maọbụ ebe ndị Ovim na Afịkpo na-asị na ha na-eri Ikeji, ọ bụ oriri ha na-eriri ji ọhụụ iji wee kelee mmụọ nwe ji bụ Nfejọọkụ maọbụ Njọkụ, ka o si duo ha n’oge ọrụ ugbo gara aga, mee ka ji ha kọrọ mee nke ọma; ha wee na-egwukwa ya n’udo.

Nke a si n’akụkwọ Ọdịnala Ndị Igbo nke Maazị Tony Ubesie dere.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.