Ncheta Alvan Ikoku

20200731 193827
Alvan Ikoku N’ihu Akwụkwọ Ego Naịra Iri Nke Naịjirịa.

Foto: Google Images.

N’ụbọchị taa n’afọ 1900 ka a mụrụ Alvan Ikoku. Ọ bụ onye Arọchukwu, nke dị n’Abịa Steeti. Ọ gara akwụkwọ praịmarị n’Arọchukwu Gọọmenti Skul bido n’afọ 1915 ruo 1920, ebe o si banye “Hope Waddel College” dị na Calabar.

Ọ malitere nkuzi na “St Paul’s College” dị n’Ọka, Anambra Steeti n’afọ 1922. O si ebe a gaa nweta nzere na “Philosophy” na mahadum London n’afọ 1928. Alvan guzokwara “Aggrey Memorial” Sekọndịrị Skul n’Arọchukwu n’afọ 1932.

Ọ zara oku ịrụrụ ala nna ya ọrụ mgbe ọ banyere “Eastern Nigerian House of Assembly” n’afọ 1946, ebe e mere ka anya ya na-eru na “Ministry of Education.” Ikoku dịka onye mara mkpa akwụkwọ dị, kabara ahụ ma mee ka gọọmenti were otu ndị nkuzi bụ “Nigerian Union of Teachers” kpọrọ ihe.

N’afọ 1962, ka ọ kwadoro ka akwụkwọ praịmarị bụrụ ihe ụmụaka ga na-agụ n’efu na Naịjirịa, nke gọọmenti mechara nabata n’afọ 1976. Ka ọ lara ezumike nka na ndọrọndọrọ ọchịchị, ọ rụkwara ọrụ na “Waec”, tinyere mahadum Ibadan.

N’ezie, Ikoku bụ odogwu nwoke nke onye ọbụla na-akwanyere ugwu maka mbọ ọ gbara n’ịkwalite agụmakwụkwọ n’ala Naịjirịa.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.