Ncheta Ada Priscilla Nzimiro

Nwaanyị Mbụ Bụ Dọkịta Bekee N'ala Igbo
IMG 20210321 193118

N’ụbọchị taa n’afọ 1951 ka Ada Priscilla Nzimiro zara oku ọnwụ. A mụrụ Ada Nzimiro na Port Harcourt n’ụbọchị iri atọ n’ọnwa April, n’afọ 1923. Aha nne ya bụ Mary Nwametụ. Nna ya bụ “Mayor” nke Port Harcourt site n’afọ 1956 ruo oge ọ nwụrụ n’afọ 1959.

Akaọrụ nne ya bụkwa ịzụ ahịa mmanụ, nnu na ihe ndị ọzọ si mba ofesi abịa. Ha bụ ndị Oguta nke dị n’Imo Steeti. Ada banyere mahadum dị na “Glasgow Scotland”, ebe ọ gụrụ ma nara ọzụzụ ịbụ dọkịta bekee bido n’afọ 1945 wee ruo mgbe ọ pụtara n’afọ 1950. Nke a mere ya nwaanyị mbụ bụ dọkịta n’ala Igbo.

Mana chi ji ehihie wee jie, wee nara ndị be Ada ụra rahụ n’afọ 1951, mgbe ọnwụ bịara kpọrọ Ada ka ọ dị naanị afọ 27. Ọnwụ ya wutere onye ọ bụla tụmadị ezinaụlọ ya. Nke a mere e ji gbanwee “William Wilberforce Academy” nke nne na nna ya guzobere wee gụọ ya “Priscilla Memorial Grammar School” iji wee na-cheta Ada. N’ihe niile, ọnwụ Ada abụghị n’efu maka na ọtụtụ ụmụnwaanyị ji maka ya nwee mmasị ma gbakwaa mbọ bụrụ dọkịta bekee n’ụbọchị taa.

Daalụ nnụ.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.