Ncheta Chiifu Hon. Odz. Janet. Nwadịọgọ, Mọkelụ

N’ụbọchị taa n’afọ 2003 ka Janet Mọkelụ zara oku ọnwụ.

Na ndụ ya, Janet Mọkelụ so n’ime ụmụnwaanyị gara akwụkwọ mgbe ụwa asabeghị anya. N’oge ahụ, ọ bụ naanị ụmụnwaanyị ndị nna ha bụ ndị nkụzi maọbụ ụkọchukwu jere akwụkwọ. Janet bụ nwa onyenkụzi ụka ndị Seemensị. Aha nna ya bụ Josef Ọnwụegbuzịa. A mụrụ Janet n’afọ 1910. Ọ gụrụ akwụkwọ praịmarị n’ebe dị iche iche nna ya rụrụ ọrụ nkụzi ụka. Otu n’ime ụlọakwụkwọ ebe ọ gụrụ akwụkwọ bụ St Mọnịka, Ogbunike. Ihe e jiri mara ya bụ “Ugwuọgba.”

N’oge ahụ, St Mọnịka bụ naanị ụlọakwụkwọ e nwere maka ụmụnwaannyị n’ọwụwa anyanwụ Naịjirịa niile. Ọ bụ na St Mọnịka ka Janet nwetara asambodo ndị nkụzi n’afọ 1932. Janet rụrụ ọrụ nkụzi n’ebe dị iche iche. Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọakwụkwọ maọbụ Hedimistres n’ụlọ akwụkwọ ndị a: Ezeoke Central School, Ọba Central School, St Bartholomew’s School, Enugu, na Christ Church School, Ụwanị Enugu.

Ebe ọzọ aha Janet dara ụda bụ na ndọrọndọrọ ọchịchị obodo. Ọ bụ ya bụ akawo otu ndọrọndọrọ NCNC nke ụmụ nwaanyị mgbe ahụ. N’afọ 1959, Zik họpụtara Janet Mọkelụ ka ọ bụrụ onye pụrụ iche so eje ụlọ ukwu ndị eze nke Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. Mgbe ahụ Zik bụ Premia nke Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa. N’afọ 1961, Janet Mọkelụ meriri mmeri dị egwu mgbe ọ zọrọ ọnọdụ onye ga na-anọchite anya Enugwu Saụtụ maka ije ụlọ ukwu ebe a na-eme iwu nke ọwụwa anyanwụ Naịjirịa.

O meriri ụmụ nwoke niile ya na ha zọrọ ọkwa a. Janet bụ ọkpọka. Ọ bụ onye na-eje ụlọ ndị Eze. Ọ bụ ya ka e ji etu ya chiifu. Ọ na-ejekwa ụlọ ukwu ebe a na-eme iwu. Ọ bụ ya ka e ji etu ya Ọnọrebụl (Honourable). Ọ bụ naanị ya bụ nwaanyị nọ n’ụlọ ukwu ndị a. Ọ na-anọchite anya ụmụ nwoke, na-anọchitekwa anya ụmụ nwaanyị, ruo 1981. Ọ bụ ya bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nke Jim Nwobodo n’oge ọ bụ gọvanọ Anambra Steeti.

Janet Mọkelụ dịka nna ukwu ndọrọndọrọ ya bụ Zik, wuru ewu. Ala anyị bụ Naịjirịa nyere Janet nzere dị elu nke a kpọrọ The Order of the Niger. N’akụkụ ihe ụka, Janet bụ isi. A sị ka e dewe ihe Janet rụụrụ ndị ụka dị iche iche, akwụkwọ ga-agwụ. Otu enyemaka dị iche iche dịka Girls’ Guides Janet so n’ime ha dị ọtụtụ. Asambodo Janet nwere na-egosi mbọ ọ gbaara ala Naịjirịa na otu ndị ọzọ dị ọtụtụ. O jere akụkụ ụwa niile maka ndọrọndọrọ.

Dịka Janet kwuru, ọ bụ site na nkwado nke di ya nyere ya ka o jiri nwee ike ịrụ ọrụ ndị a. Ọ dịkwa mkpa ka ụmụ nwaanyị lere nzọụkwụ ya anya.


Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.