
Ọjị bụ osisi. Ọ na-amịta ogbe nke e si na ya enweta mkpụrụ ọjị. Ọ bụ mkpụrụ ọjị ka ndị Igbo na-enye ọbịa iji gosi ya nnabata na ihuọma. Ọ bụrụ na e nye ọbịa ọjị, e nyeghị ya ka o tinye ya n’akpa wee lawa; e nyeghịkwa ya ka ọ taa naanị ya. Ọ bụrụ na ọjị e nyere ọbịa karịrị otu, o na-ewere otu ọjị tinye n’akpa sị, “ọjị ruo ụlọ, ọ kaa ebe o si.” Nke fọdụrụnụ, a na-awa ya, onye ọ bụla nọ ebe ahụ ataa ya.
Ịwa ọjị bụ otu n’ime omenala ndị Igbo nke zuru Igbo ọnụ mana usoro e si awa ya abụghị otu. Akụkụ ọ bụla n’ala Igbo nwere usoro ha si awa ọjị. A bịa n’Anambra Steeti, akụkụ Agụata, Ọka na Ọnịcha, ọ bụ okenye na ndị chiri echichi na-awa ọjị. Etu ahụkwa ka ọ dị n’obodo ụfọdụ n’Imo Steeti, dị ka n’Akọọkwa, Uruala na Ọlụ. N’Imo Steeti na Abịa Steeti, obodo dị ka Owere, Ụmụahịa, Ọhafịa, Isukwuatọ na obodo ụfọdụ gbara ha gburugburu na-awa ọjị na nwata. Etu ahụ ka ọ dịkwa n’obodo ụfọdụ dị n’Enugwu Steeti, dị ka Udi, Achị, Oduma na Inyi.
Obodo ndị a na-awa ọjị na nwata kwenyere na ụmụaka amaghị ihe ọjọọ. Ha kwenyekwara na ọ bụ nwata na-ejere okenye ozi. Okenye gọsịa ọjị, o bunye nwata ka ọ waa. N’obodo ụfọdụ, dị ka Ọnịcha nke dị n’Anambra Steeti na Asaba nke dị na Delta Steeti, e nwere ka ụbọchị ga-adị ebe niile abụrụ sọ ụmụaka, a hụghị ka e mere, e mee ka a hụrụ– okenye nwaanyị ga-awa ọjị ebe ụmụaka nọ.
N’ala Igbo dum, ọ bụkarị ụmụ nwoke na-awa ọjị. N’ọgbakọ ụmụ nwaanyị, ọ bụrụ na e nwee nwata nwoke nọ n’etiti ha, ha na-ewere aka ya binye n’ọjị ahụ tupu a waa ya. Nke a pụtara na o nyela ha ikike ka ha waa ọjị ahụ ebe ọ bụ na ọ dịghị nwoke toro eto nọ ya. N’ebe niile n’ala Igbo, a na-agọ ọjị agọ tupu a waa ya. Ndị Igbo na-ekwu okwu sị, “e jide ọjị n’aka ndị mmụọ egewe ntị.” Ọ bụ oge a ka e ji agọ ọfọ, kpee ekpere wee waa ọjị. Onye ịwa ọjị ruuru nwere ike inye onye ọzọ ikike ka ọ waara ya ọjị.
Mgbe ahụ, onye ahụ na-ekwu sị, “nri ọkụ a gụnyere nwata n’aka anaghị ahụgbu ya.” Ọ na-ewere ọjị ahụ gọọ ọfọ ma wakwaa ya. N’ezie, ịwa ọjị bụ omenala nke ndị Igbo si na ya ezipụta ugwu na nsọpụrụ dịịrị onye ọ bụla.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

