
Ọjị
Ọjị bụ mkpụrụ osisi dị nsọ ma nwekwaa nsọpụrụ n’ala Igbo. E ji ọjị ele ọbịa, eme omenala dị iche iche, dị ka ịlụ nwaanyị, ichi ọzọ, igba afa wdg. Ejikwazị ọjị agọ mmụọ. N’eziokwu, ọjị bara nnukwu uru n’ala Igbo. Ọ bụ ya mere ndị Igbo ji asị: “onye wetere ọjị wetere ndụ.” Ọ bụghị sọ nke a, ọjị na-egosi ifụnanya n’ebe udo dị. Ọjị dị oke mkpa n’ala Igbo. Ọ bụ ya mere ihe ọ bụla a ga-eme, ọjị na-ebute ụzọ. Ọgbalụ kwesịrị ike na nke a, mgbe ọ sịrị: “ya mere ihe ọ bụla a ga-eme n’ala Igbo, ma ọ bụ idozi okwu, ma ọ bụ ị gọ mmụọ, ma ọ bụ ile ọbịa, n’ihe mbụ a ga-eme bụ iche ọjị.’’ (51.)
Ihe nke a pụtara bụ n’ọjị bara nnukwu uru n’ala Igbo gbaa gburu gburu. Ọ bụ ya jikọrọ ala Igbo niile ọnụ mere o jiri bụrụ ọdịnala jikọrọ Igbo.
Ihe Mere Nwaanyị Anaghị Awa Ọjị Dịka Nwoke N’Ala Igbo

Ọjị dị nsọ. N’omenala Igbo, anaghị ari elu ọjị aghọ ọjị, nke eji ezu ohi ọjị. Chinụa Achebe kwenyesịrị ike na nke a n’ime akwụkwọ agụmagụ a kpọrọ “There Was a Country.”
Ọ sịrị “Now often there were taboos about picking kolanuts. Traditionally, no one was allowed to pick them from the tree. They were supposed to ripen, fall and then be collected from the ground, and by men, not women”. (10) A sụgharịa ya n’igbo: “Ọtụtụ mgbe, ọ bụ nsọala itụtụ ọjị. N’omenala Igbo, o nweghị onye nwere ikike ịghọ ọjị. Ọjị kwesịrị ika aka, daa, tupu atụtụrụ ya. Ọzọkwa, ndị nwere ike ime nke a bụ ụmụ nwoke, ọ bụghị ụmụ nwaanyị.” Ị lee anya nke ọma n’okwu a, ị ga-amata n’ebe ụmụ nwaanyị enweghị ike itụtụ ọjị dara n’ala, ọ bụzị ị gọ ya ka ha ga-enwe ike ya? N’ihi nke a mere na ha adịghị agọ ọjị n’ihi na ha bụ nwaanyị.
Nke abụọ bụ na ndị Igbo kwenyere n’ọjị bụ oke osisi. Ọjị bụ isi ma ọ bụ nwoke dị ka nkwenye ndị Igbo siri dị. Ebe ọjị bụ nwoke, ụmụ nwaanyị ekwesịghị ị gọ ya, maka ndị Igbo kwuru n’isi ji adịghị adị n’ala, ọdụdụ ya e puo ome.
Nke atọ bụ omenala. Nke bụ isi sekpụ ntị n’ihe niile a kọwara mere ụmụ nwaanyị ejighị a gọ ọjị. Ọ bụ omenala ji isi ihe niile a na-eme n’ala Igbo. Ọ bụ usoro ndị Igbo ji ebi ndụ ha. Ọzọkwa, ọ bụ nkwenye omume e jiri mara ndị Igbo. Omenala na-egosi ihe ndị na-eme, ihe ndị na-ekwu, na ihe ndị kwenyere. Ọ bụ n’ọnọdụ a mere na nwaanyị anaghị awa ma ọ bụ gọọ ọjị n’ala Igbo. Nke a gosiri n’ụmụ nwaanyị anaghị awa ọjị n’ala Igbo bụ ọnọdụ omenala debere ha. Chinụa Achebe gosipụtara nke a mgbe ọ kọọrọ ọnọdụ omenala debere ụmụ nwaanyị n’ebe ọjị dị. N’akụkọ ya, ọ sịrị na nne ya weere ngu wee ghọtuo obere ọjị, nke a mere ka akpọpụ ya n’aka ụmụnna ndị hụrụ akparamagwa ya dị ka nsọala.
Lee ka o siri gaa n’akwụkwọ ya: “The neighbour reported this incident to the men folk, who then exaggerated the insult to our tradition. (10.) Ihe nke a pụtara bụ na omenala machibidoro nwaanyị ịgọ ọjị. Ihe kpatara ya bụ n’ọjị dị nsọ. Ọ bụ ya mere Chinụa Achebe jiri kwuo sị “The kolanut was a sacred fruit and had a very distinct and distinguished role to play in Igbo life and culture.
N’ikpeazụ, n’ịsụgharị ihe Achebe kwuru, mere ka o doo anyị anya n’ọjị bụ osisi dị asọ nke nwere ọtụtụ ọrụ ọ na-arụ na ndụ ya na omenala ndị Igbo. Ọ bụ ihe ndị a mere na nwaanyị anaghị a gọ ọjị n’ala Igbo. Nwaanyị ị gọ ọjị n’ala Igbo na-egosi na nwoke anọghịzị n’ala Igbo. Anyị ga-amata na nwoke bụ isi ihe niile n’ala Igbo. E nweghị ebe a chụrụ aja udele na-anọghị ya. N’ihi ya, nwaanyị ị gọ ọjị dị ka ebe a hapụrụ isi aka gbawa ụriom. Nke a jọgburu onwe ya, maka ọ bụghị ka omenala Igbo siri dowe ya.
Odee: Osinakachukwu Onyemaechi
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

