
N’oge gara aga, ndị Igbo bụ ndị na-ahụ ime ihe ike n’anya. Ya mere ụfọdụ ji eri mmadụ, na-apụnara mmadụ ihe, na-achọ ime ihe dị iche iche. N’ihi nke a, ọ dị mgbe ha na-atụ aka ihe ha mere. Ọ bụ mgbe ikoro dara ka a na-eji amata nwoke bụ nwoke.
Ịkoro bụ ukwu osisi a tụrụ atụ ka ekwe. A na-akpa ihe ebe a na-edebe ya ka arụrụ ọcha maọbụ mkpu ghara ịta ya. Mgbe ịkoro dara, ndị bụ nwoke anwụrụ mma ha n’aka na-agba piti piti piti. A hụ ha, ọ dị ka ogwu enweghị ike ịdupu ha ahụ.
Ha na-awara ajị ha, kpuru okpu, tunye ha abụba ugo chara nzu. Ọ bụrụ n’oge gboo, ha eburusịa isi mmadụ maọbụ aka mmadụ ha gburu n’aka. Ha na-eso ịkoro ahụ gburugburu, na-agba ya mgbe onye na-akụ ya na-akụ. Ọ na-eji ịkoro ahụ akpọ ha aha n’otu, n’otu.
Onye a kpọrọ ọ pụta n’ọgbọ gosi otu o si mee ihe ike o mere. Mgbe ọ mechara pụọ, ibe ya etue ya aha, ọ na-aza. E mechaa, a kpọọ onye ọzọ. Mgbe ha mezuru nke a, ha ebido gbawa sọọsọ egwu. Ike gwụchaa ha, ha alasaa. Ndị ụmụnwaanyị adịghị agba ịkoro.
Ndị nwoke na-emebeghị ihe ike adịghịkwa agba ịkoro. Ha pụta ebe a na-agba ịkoro, ibe ya na-ejide ya mee ya ihe ọchị, e bunye ya ọkụ mmanụ n’isi, ibe ya esi ebe ahụ na-esuru ji ha hụrụ n’ọkụ. Ya mere nwoke dum ji agbali mee ihe ike, ka a ghara iji ya mee ihe ọchị.
Site mgbe chọọchị bịara, ịgba ịkoro otu a alaala n’ihi na onye mee ihe ike ugbua, ndị uweojii emee ya ihe ọ na-agaghị echefu na ndụ ya. N’obodo ụfọdụ, a na-akpọ ịgba ịkoro, ịgba abịa. Otu e si agba abịa bụ otu e si agba ịkoro.
Kama na ọ bụ naanị n’ịkwa ozu nwoke tozuru etozu ka e ji agba ya. Nwaanyị adịghị agba ịkoro, ọ dịghịkwa agba abịa.
Ọ gwụla.
Edemede a si n’akwụkwọ Omenala Igbo nke F.C Ọgbalụ deere.
Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

