Ncheta Chukwuemeka Ike

"Nne na Nna ya gụrụ ya aha bekee bụ Vincent, ma dịka nwaafọ maara ihe ekwe na-akụ, o mechara kwuo ma kwusie ike sị kpọwa ya aha Igbo ya bụ Chukwuemeka."
ike

A mụrụ Chukwuemeka n’ụbọchị iri abụọ na asatọ n’ọnwa April n’afọ 1931. Ọ bụ onye Ndịkeliọnwụ nke dị n’Anambra Steeti, ma bụrụkwa eze na-achị ha tutu ọ nwụọ dịka nna ya si wee bụrụ. Nne na Nna ya gụrụ ya aha bekee bụ Vincent, ma dịka nwaafọ maara ihe ekwe na-akụ, o mechara kwuo ma kwusie ike sị kpọwa ya aha Igbo ya bụ Chukwuemeka.

Ọ gara akwụkwọ na Government College Ụmụahịa, ma gaa mahadum nke dị na Ibadan, tinyekwara mahadum Stanford dị na Amerịka. Ike si n’akwụkwọ o deere megide ojoro nke ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-egwu n’ule were a banye mahadum, ya na nke a a na-emekwa oge ụfọdụ were ewepụta onyeisi mahadum.

Ọzọkwa, akwụkwọ ya megidere ụfọdụ ihe na-akpụghachi obodo azụ.Akwụkwọ ọ degasiri bụ ndị a:Toads for Supper(1965)The Naked Gods(1970)The Potter’s Wheel(1973)Sunset at Dawn(1976)Expo 77(1980)The Chicken Chasers(1980)The Bottled Leopard (1985)Our Children Are Coming(1990)

Ọnwụ kpọrọ ya oku n’ụbọchị iteghete n’ọnwa January n’afọ 2020. Ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ tutu ọ nwụọ.

ike3

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe to get the latest posts sent to your email.

Gbasaa ozi a

Edemede ndị ọzọ

Discover more from Mbido Igbo

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Nweta Akụkọ Ọhụrụ

Debanye aha ka ị na-anata akụkọ Igbo ọhụrụ, akwụkwọ ọhụrụ, na ozi dị oke mkpa n’email gị.