
A mụrụ Chukwuemeka n’ụbọchị iri abụọ na asatọ n’ọnwa April n’afọ 1931. Ọ bụ onye Ndịkeliọnwụ nke dị n’Anambra Steeti, ma bụrụkwa eze na-achị ha tutu ọ nwụọ dịka nna ya si wee bụrụ. Nne na Nna ya gụrụ ya aha bekee bụ Vincent, ma dịka nwaafọ maara ihe ekwe na-akụ, o mechara kwuo ma kwusie ike sị kpọwa ya aha Igbo ya bụ Chukwuemeka.
Ọ gara akwụkwọ na Government College Ụmụahịa, ma gaa mahadum nke dị na Ibadan, tinyekwara mahadum Stanford dị na Amerịka. Ike si n’akwụkwọ o deere megide ojoro nke ụfọdụ ụmụ akwụkwọ na-egwu n’ule were a banye mahadum, ya na nke a a na-emekwa oge ụfọdụ were ewepụta onyeisi mahadum.
Ọzọkwa, akwụkwọ ya megidere ụfọdụ ihe na-akpụghachi obodo azụ.Akwụkwọ ọ degasiri bụ ndị a:Toads for Supper(1965)The Naked Gods(1970)The Potter’s Wheel(1973)Sunset at Dawn(1976)Expo 77(1980)The Chicken Chasers(1980)The Bottled Leopard (1985)Our Children Are Coming(1990)
Ọnwụ kpọrọ ya oku n’ụbọchị iteghete n’ọnwa January n’afọ 2020. Ọ gbara afọ iri asatọ na asatọ tutu ọ nwụọ.

Edemede Ndị Ọzọ
Discover more from Mbido Igbo
Subscribe to get the latest posts sent to your email.

